Jeremaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52


Isi 43

O rue, mb͕e Jeremaia gwabìri ndi Israel nile okwu nile nke Jehova, bú Chineke-ha, nke Jehova, bú Chineke-ha, zigara ya ka o were ha jekuru ha, bú okwu ndia nile,
2 Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:
3 kama Beruk nwa Neraia nākpali gi imegide ayi, ka o we nye ayi n'aka ndi Kaldea, ka ha we me ka ayi nwua, me kwa ka ayi je biri na Babilon.
4 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na ndi Israel nile, we ghara ige nti olu Jehova, ibi n'ala Juda.
5 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, we chiri ndi Juda nile fọduru, bú ndi siri na mba nile ebe achugara ha-ri lata inọ dika ọbìa n'ala Juda;
6 bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na umu-ndinyom eze, na madu ọ bula nke Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ọ nọdu n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, na Jeremaia, bú onye-amuma, na Beruk nwa Neraia;
7 ha we ba n'ala Ijipt; n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ha we biarue Tahpanhes.
8 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti na Tahpanhes, si,
9 Were nkume di uku n'aka-gi, zobe ha n'urọ n'ebe ahu anākpu brick nke di n'ọnu-uzọ ulo Fero na Tahpanhes, n'anya ndi Juda;
10 si ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iziga kuru Nebukadreza, eze Babilon, bú orùm, dọkwasi oche-eze-ya n'elu nkume ndia nke m'zobeworo; ọ gēseti kwa ulo-ǹdò-ya n'elu ha.
11 Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n'ọnwu, ndi diri ndọta-n'agha ka agēnye na ndọta-n'agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha.
12 M'gēsuye kwa ọku n'olu nile nke chi nile nke Ijipt; o gēsure kwa ha ọku, dọta ha n'agha: ọ gēji kwa ala Ijipt kpuchie onwe-ya dika onye-ọzùzù-aturu si eji uwe-ya kpuchie onwe-ya; o gēsi kwa n'ebe ahu pua n'udo.
13 O gētipia kwa ogidi nile nke ulo anyanwu, nke di n'ala Ijipt; ọ bu kwa ulo nile nke chi nile nke Ijipt ka ọ gēsure n'ọku.