Jeremaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52


Isi 15

Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n'irum, nkpuru-obim agaghi-adi n'ebe ndi nka nọ: chupu ha n'irum, ka ha pu kwa.
2 O gēru kwa, mb͕e ha gāsi gi, Òle ebe ayi gāpu? i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ndi diri ọnwu gāpukuru ọnwu; ndi diri mma-agha gāpukuru mma-agha; ndi diri oké unwu gāpukuru oké unwu; ndi diri ndọta-n'agha gāpukuru ndọta-n'agha.
3 M'gēme kwa ka ab͕uru ihe anọ buru ndi-nlekọta-ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mma-agha ib͕u eb͕u, na nkita idọb͕u adọb͕u, na anu-ufe nke elu-igwe, na anumanu nke uwa, iripia na ibibi.
4 M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.
5 N'ihi na ònye gēnwe ọmiko n'aru gi, Jerusalem? ma-ọbu ònye gēgosi gi ebere o nwere n'aru gi? ma-ọbu ònye gēwezuga onwe-ya iju ajuju bayere udo-gi?
6 Gi onwe-gi arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), azu ka i nālaghachi: M'we setipu akam imegide gi, we bibie gi; ike ncheghari agwusiwom.
7 M'we were ihe-nfucha fucha ha n'ọnu-uzọ-ama nke ala nka; ab͕abawom ha aka umu, emewom ka ndim la n'iyì; ha esighi n'uzọ nile ha lata.
8 Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n'etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede.
9 Nwayi nke muworo umu asa atalatawo; o kubìwo ume; anyanwu-ya adawo mb͕e ubọchi fọduru; ihere emewo ya, o we nwe iru-ihere: ọzọ, ndi-ha fọduru, ọ bu n'aka mma-agha ka M'gēnye ha n'iru ndi-iro-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
10 Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n'ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n'uma; madu ebinyeghkwam ego n'uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham.
11 Jehova siri, N'ezie atọpuwom i ime ezi ihe; n'ezie emewom ka onye-iro-gi riọ gi aririọ na mb͕e ihe ọjọ na nime mb͕e nkpab͕u.
12 Àgētiji ígwè si n'Ugwu puta, na ọla?
13 Ume-gi na àkù-gi nile ka M'gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n'agha, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ma n'ihi nmehie-gi nile, ọbuná n'ókè-ala-gi nile.
14 M'gēme kwa ka ha soro ndi-iro-gi gabiga n'ala i nāmagh: n'ihi na amuyewo ọku n'iwem, n'aru unu ka ọ gēre.
15 Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n'eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n'ihi Gi.
16 Achọputawo okwu-Gi, m'we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n'ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha.
17 Anọdughm ala n'ìzù nzuzo nke ndi nāchì ọchì nke-uku, aṅurighkwam ọṅu: n'ihi aka-Gi náním otú nọduru ala; n'ihi na oké iwe ka I jiworo mejuem.
18 N'ìhi gini ka ihe-nb͕um digidere mb͕e nile? n'ìhi gini ka ntiputa-ọnyám nādighi ngwọta? ọ juwo ka agwọta ya. Ì gāburum nání ihe di ka miri-iyi nārafu arafu, dika miri na-ekwesighi ntukwasi-obi?
19 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Ọ buru na i lata, M'gēme kwa ka i lata, n'irum ka i gēguzo; ọ buru na i me ka ihe di oké ọnu-ahia si n'ihe jọb͕uru onwe-ya puta, dika ọnum ka i gābu: ndi ahu gālaghachikute gi, ma gi onwe-gi agaghi-alaghachikute ha.
20 M'gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
21 M'gānaputa kwa gi n'aka ndi ọjọ, b͕aputa gi n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji.