Jeremaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52


Isi 44

Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi-Ju nile ndi bi n'ala Ijipt, ndi bi na Migdol, na nime Tahpanhes, na nime Nof, na n'ala Patros, si,
2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu onwe-unu ahuwo ihe ọjọ ahu nile nke M'meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, biakwasi kwa obodo nile nke Juda; ma, le, ha bu nkpọnkpọ ebe ta, ọ dighi kwa onye bi nime ha;
3 n'ihi ihe ọjọ ha nke ha meworo ikpasum iwe, n'ije isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ifè chi ọzọ di iche iche, ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha, ma-ọbu unu onwe-unu, ma-ọbu nna-unu-hà.
4 M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, unu emela ihe-árú a nke M'kpọworo asì.
5 Ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n'ala isi n'ihe ọjọ ha chigharia, ighara isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
6 Ewe wusi ọnumam na iwem, o we re ọku n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem; ha we ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika o si di ta.
7 Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n'ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n'etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;
8 n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa?
9 Ùnu echezọwo ihe ọjọ nile nke nna-unu-hà, na ihe ọjọ nile nke ndi-eze Juda, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-ha, na ihe ọjọ nile nke unu, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-unu, nke ha mere n'ala Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem?
10 Azọpiaghi ha n'obi rue ta, ha atughi kwa egwu, ha ejegharighi kwa n'iwum, na n'ukpurum nile, nke M'tiyere n'iru unu na n'iru nna-unu-hà.
11 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ido irum imegide unu ime unu ihe ọjọ, ọbuná ibipu Juda nile.
12 M'gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n'ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n'oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n'oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta.
13 M'gēji kwa nmehie nke ndi bi n'ala Ijipt leta ha, dika M'jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:
14 ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ọbuná ilaghachi n'ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n'ebe ahu: n'ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu.
15 Ndikom ahu nile ndi mara na ndinyom-ha nēsurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ndinyom nile ndi nēguzo n'ebe ahu, ọ bu nkpọkọta di uku, ọbuná ndi Israel nile ndi bi n'ala Ijipt, nime Patros, ha we za Jeremaia, si,
16 Okwu ahu nke i gwaworo ayi n'aha Jehova, ayi agaghi-adi nēge gi nti.
17 Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n'ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru.
18 Ma site na mb͕e ayi rapuru isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nile akọwọ ayi, ọ bu kwa site na mma-agha na site n'oké unwu ka emeworo ka ayi gwusia.
19 Ma mb͕e ayi onwe-ayi nēsurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāwusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bu mb͕e di-ayi nēkweghi ka ayi meworo ob͕e achicha nye ya ime onyinyo-ya, wusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu?
20 Jeremaia we gwa ndi Israel nile, ma ndikom ma ndinyom, ọbuná ndi Israel nile ndi nāza ya okwu, si,
21 Ọ̀ bughi ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke unu surere n'obodo nile nke Juda na n'èzí nile nke Jerusalem, unu onwe-unu, na nna-unu-hà, na ndi-eze-unu, na ndi-isi-unu, na ndi ala ahu, ọ̀ bughi ihe ndia ka Jehova chetara, ihe ahu we bata n'obi-Ya?
22 Jehova apughi kwa inagide kwa ọzọ, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu, n'ihi ihe-árú nile nke unu meworo; ala-unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, ghara inwe onye-obibi, dika o si di ta.
23 N'ihi na unu esurewo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, we ghara ige nti olu Jehova, ghara kwa ijeghari n'iwu-Ya, na n'ukpuru-Ya nile, na n'ihe-àmà-Ya nile; n'ihi nka ka ihe ọjọ a dakwasiworo unu, dika o si di ta.
24 Jeremaia we si ndi Israel nile, si kwa ndinyom ahu nile, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi nọ n'ala Ijipt:
25 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si: Unu onwe-unu na ndinyom-unu ji ọnu-unu ekwu okwu, ọ bu kwa aka-unu ka unu jiworo mezu ya, si, Ayi aghaghi ime nkwa nile ayi nke ayi kweworo, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu: menu ka nkwa nile unu guzosie ike n'ezie, me-kwa-nu ihe nile unu kwere na nkwa n'ezie.
26 N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi bi n'ala Ijipt: Le, Mu onwem ewerewo aham di uku ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na aham agaghi-abu kwa ọzọ ihe anākpọ n'ọnu onye ọ bula nke Juda n'ala Ijipt nile, si, Onye-nwe-ayi Jehova nādi ndu.
27 Le, Mu nāmu anya n'aru ha ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha nma: agēme kwa ka ndi Juda nile, bú ndi nọ n'ala Ijipt, gwusia site na mma-agha na site n'oké unwu, rue mb͕e ha gāgwusi.
28 Ma ndi b͕apuworo na mma-agha gēsi n'ala Ijipt laghachi n'ala Juda, ndikom ole-na-ole; ndi Juda nile fọduru, bú ndi biaruworo ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ewe mara onye okwu-ya gēguzosi ike, nkem, ma-ọbu nke ha.
29 Ma nka gāburu unu ihe-iriba-ama, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na Mu onwem nēji nmehie-unu leta unu n'ebe a, ka unu we mara na okwum nile aghaghi iguzosi ike imegide unu ime unu ihe ọjọ:
30 otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje inye Fero Họfra, bú eze Ijipt, n'aka ndi-iro-ya, na n'aka ndi nāchọ ndu-ya; dika M'nyere Zedekaia, bú eze Juda, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, bú onye-iro-ya, nke nāchọ kwa ndu-ya.