Jeremaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52


Isi 11

Okwu nke ruru Jeremaia nti site n'aka Jehova, si,
2 Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu;
3 i gāsi kwa ha, Otúaka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Onye anābu ọnu ka onye ahu bu nke nādighi-anu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a,
4 nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, si n'oké ọku ígwè ahu, puta, si, Genu nti olum, me ha, dika ihe nile si di nke M'nēnye unu n'iwu: unu ewe burum otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke:
5 ka M'we me ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru nna-unu-hà, inye ha ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya, dika o si di ta. M'we za, si, Amen, Jehova.
6 Jehova we sim, Kpọsa okwu ndia nile n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, si, Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha.
7 N'ihi na ab͕aworom nna-unu-ha àmà nke-uku n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, rue ta, nēbili n'isi-ututu nāb͕a àmà, si, Genu nti olum.
8 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we jegharia, onye ọ bula n'isi-ike nke obi ọjọ ha: M'we me ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a biakwasi ha, bú nke M'nyere n'iwu ka ha me, ma ha emeghi ha.
9 Jehova we sim, Achọputawo nkekọta imegidem n'etiti ndi Juda, na n'etiti ndi bi na Jerusalem.
10 Ha alaghachikuruwo ajọ omume nile nke ndi bu nna-ochie-ha, ndi juru inu okwum nile; ha onwe-ha ejesowo kwa chi ọzọ di iche iche ifè ha òfùfè: ulo Israel na ulo Juda emebiwo ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara.
11 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M'gaghi-ege ha nti.
12 Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha.
13 N'ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
14 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n'ihi na M'gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n'ihi ihe ọjọ ha.
15 Gini ka nwayi nke ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere n'ulom, ebe ya na ọtutu madu meworo ajọ ihe-nzube, ọzọ, anu nsọ nēsi kwa n'aru gi gabiga? mb͕e i nēme ihe ọjọ, mb͕e ahu ka i nāṅuri ọṅu.
16 Osisi olive di ndu, nke mara nma n'imì nkpuru ọma, otú a ka Jehova kpọrọ aha-gi: n'olu nkpọtu uku ka O suyeworo ya ọku, alaka-ya nile anyakasiwo kwa.
17 N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye ahu nke kuworo gi n'ala, ekwuwo ihe ọjọ megide gi, n'ihi ihe ọjọ nke ulo Israel na ulo Juda, nke ha meworo onwe-ha n'ikpasum iwe n'isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
18 Jehova me-kwa-ram ka m'mara ya, m'we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m'hu omume nile ha.
19 Ma mu onwem di ka nwa-aturu azùbiri azùbi nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya; ma amaghm na ọ bu mu ka ha zubereri nzube megide, si, Ka ayi bibie osisi na ihe-oriri-ya, ka ayi bipu kwa ya n'ala ndi di ndu, ka ewe ghara icheta kwa aha-ya ọzọ.
20 Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nēkpe ikpe n'ezi omume, Onye nānwa akuru na obi, kwe ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha: n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpem.
21 N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi Anatot, bú ndi nāchọ ndu-gi, si, I gaghi-ebu amuma n'aha Jehova, ka i we ghara inwu site n'aka-ayi:
22 n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a, Le, M'gaje iwere nmehie-ha leta ha: umu-okorọbia-ha gānwu site na mma-agha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gānwu site n'oké unwu;
23 ọ dighi kwa ndi fọduru ha gēnwe: n'ihi na M'gēme ka ihe ọjọ biakute ndi Anatot, n'arọ nleta-ha.