Jeremaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52


Isi 19

Otú a ka Jehova siri, Je, zuta karama nke ọkpu-ite ji urọ akpu, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye ndim, na nime ndi-okenye ndi-nchu-àjà;
2 purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n'ebe ahu okwu nile nke M'gāgwa gi:
3 si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.
4 N'ihi na ha arapuwom, we ghara imata ebe a, we surere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ nime ya, bú ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha na ndi bu nna-ha na ndi-eze Juda; ha emejuwo kwa ebe a n'ọbara ndi nēmeghi ihe ọjọ;
5 ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n'ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M'nēnyeghi n'iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n'obim:
6 n'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ebe a Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u.
7 M'gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n'ebe a dika miri; M'gēme kwa ka ha da site na mma-agha n'iru ndi-iro-ha, na site n'aka ndi nāchọ ndu-ha: M'gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri.
8 M'gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.
9 M'gēme kwa ka ha rie anu-aru nke umu-ha ndikom na anu-aru umu-ha ndinyom, ha gēri kwa, onye ọ bula anu-aru ibe-ya, nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-ha na ndi nāchọ ndu-ha nākpab͕u ha.
10 I gētiwa kwa karama ahu n'anya ndikom ahu, bú ndi nēso gi je,
11 i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọbuna otú a ka M'gētiwa ndi nka na obodo a, dika madu si etiwa ite ọkpu-ite, nke anāpughi imezi kwa ya ọzọ: ọ bu kwa na Tofet ka ha gēlì ozu, n'ihi na ebe ilì ozu adighi.
12 Otú a ka M'gēme ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa ndi bi ya, ọbuná ime obodo a ka ọ di ka Tofet:
13 ulo nile nke Jerusalem na ulo nile ndi-eze Juda, nke ruru árú, gādi kwa ka ebe Tofet, bú ulo nile nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì uto n'elu-ha nye usu nile nke ihe elu-igwe, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu.
14 Jeremaia we si na Tofet bia, ebe Jehova zigara ya ibu amuma; o we guzo n'ogige ulo Jehova, si ndi Israel nile:
15 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ a nile biakwasi obodo a, biakwasi kwa obodo-ya nile, bú nke M'kwuworo megide ya; n'ihi na ha ekwesiwo olu-ha ike, ka ha ghara inu okwum nile.