Jeremaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52


Isi 13

Otú a ka Jehova sirim, Je, zutara onwe-gi ihe-ọkiké nke flax, tukwasi ya n'úkwù-gi, ma emela ka ọ ba na miri.
2 M'we zuta ihe-ọkiké dika okwu Jehova si di, m'we tukwasi ya n'úkwù.
3 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si,
4 Were ihe-ọkiké ahu nke i zutaworo, nke di n'úkwù-gi, bilie, je Yufretis, zobe ya n'ebe ahu nime nb͕awa nke nkume di elu.
5 M'we je, zobe ya n'akuku Yufretis, dika Jehova nyerem iwu.
6 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe ahu, bú nke M'nyere gi iwu izobe n'ebe ahu.
7 M'we je Yufretis, gwue, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe m'zobere ya-ri: ma, le, ihe-ọkiké ahu ebibiwo, ọ bàghi n'ihe ọ bula.
8 Okwu Jehova we ruem nti, si,
9 Otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēbibi npako Juda na npako bara uba nke Jerusalem.
10 Ndi ọjọ nka ndi nāju inu okwum nile, ndi nējeghari n'isi-ike nke obi-ha, we jeso chi di iche iche ọzọ ifè ha, na ikpọ isi ala nye ha, ndi nka gādi kwa ka ihe-ọkiké a, nke nādighi-abà n'ihe ọ bula.
11 N'ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n'úkwù madu, otú a ka M'meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n'arum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi.
12 I gāgwa kwa ha okwu a, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Agāb͕aju ite ọ bula manya-vine: ha gāsi kwa gi, Ọ̀ bu na ayi amaghi na agāb͕aju ite ọ bula manya-vine?
13 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n'ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem.
14 M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha.
15 Nurunu, ge kwa nti; unu adila elu n'obi: n'ihi na Jehova ekwuwo.
16 Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.
17 Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n'ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n'anyam nke-uku, anya-miri ewe si n'anyam rùda, n'ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n'agha.
18 Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.
19 Emechiwo obodo nile nke Negeb, ọ dighi kwa onye nēmeghe ha: emewo ka Juda je biri n'ala ọzọ, ha nile emezuwo ka ọ je biri n'ala ọzọ.
20 Welie anya-unu, hu ndi nēsi n'Ugwu bia: òle ebe ìgwè aturu enyere gi, bú ìgwè ewu na aturu-gi mara nma?
21 Gini ka i gāsi, mb͕e Ọ gēwere nmehie-gi leta gi, ebe gi onwe-gi zíworo ndi ahu imegide gi, bú ezi ndi-eyì-gi, ka ha buru ndi-isi-gi? ihe-nb͕u di iche iche, hà agaghi-ejidesi gi ike, dika nwanyi ime nēme?
22 Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.
23 Onye Etiopia, ọ̀ gāb͕anwe akpukpọ-aru-ya? ma-ọbu agu, ọ̀ gāb͕anwe agwa-ya? ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ.
24 M'gāchusa kwa ha, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke nāgabiga, nye ifufe ọzara.
25 Nka bu ihe efetara gi na nzà, òkè nke atùworo nye gi site nam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na i chezọwo Mu onwem, we tukwasi okwu-ugha obi-gi.
26 Ya mere Mu onwem ji kpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi rue iru-gi, ewe hu nlelì-gi.
27 Ikwa-iko-gi nile, na ọbube-gi nile dika inyinya, nzube ọjọ nke ikwa-iko-gi, n'elu ugwu ntà nile n'ọhia, ahuwom ihe-árú-gi nile ndia. Ahuhu diri gi, Jerusalem! i gaghi-adi ọcha; #mb͕e ole gāgabiga tutu ọ di?