Ọnu-Ọgugu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 7

O rue, n'ubọchi Moses guzosiri ebe-obibi ahu, te ya manu, do ya nsọ, na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, mb͕e ọ tesiri ha manu, do ha nsọ;
2 na ndi-isi Israel, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, wetara ihe nso; ndi ahu bu ndi-isi ebo nile, ndi ahu bu ndi nēguzo n'isi ndi agukọtara agukọta:
3 ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n'iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n'iru ebe-obibi ahu.
4 Jehova we gwa Moses okwu, si,
5 Nara ha n'aka-ha, ka ha we buru ihe iji fè òfùfè nke ulo-ikwū nzute; i gēwere kwa ha nye ndi Livai, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di.
6 Moses we nara ugbala nile na ehi nile, nye ha ndi Livai.
7 Ugbala abua na ehi anọ ka o nyere umu Giashon, dika òfùfè-ha si di:
8 ugbala anọ na ehi asatọ ka o nye-kwa-ra umu Merari, dika òfùfè-ha si di, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.
9 Ma ọ nyeghi umu Kohat: n'ihi na òfùfè nke ebe nsọ dikwasi ha; n'ubu ka ha nēbu ya.
10 Ndi-isi we weta nso onyinye irara ebe-ichu-àjà nye Chineke n'ubochi etere ya manu, ndi-isi ahu we weta nso onyinye-ha iji biaru nso n'iru ebe-ichu-àjà.
11 Jehova we si Moses, Otù onye-isi otù ubọchi, otù onye-isi otù ubọchi, ka ha gēweta nso onyinye-ha iji biaru nso, bayere ira ebe-ichu-àjà nye Chineke.
12 Onye nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso n'ubọchi mbu bu Nahshon nwa Aminadab, nke ebo Juda:
13 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
14 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;
15 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
16 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
17 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Nahshon nwa Aminadab.
18 N'ubọchi nke-abua Netanel nwa Zua, onye-isi Isaka, wetara ihe-ya nso:
19 o wetara nso onyinye-ya iji biaru nso: otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
20 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
21 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
22 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
23 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Netanel nwa Zua.
24 N'ubọchi nke-atọ onye-isi umu Zebulun nwere, bú Eliab nwa Hilon, wetara ihe-ya nso;
25 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
26 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
27 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
28 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
29 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliab nwa Hilon.
30 N'ubọchi nke-anọ onye-isi umu Reuben nwere, bú Elizua nwa Shedeua, wetara ihe-ya nso:
31 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
32 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
33 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
34 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
35 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù, arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elizua nwa Shedeua.
36 N'ubọchi nke-ise onye-isi umu Simeon nwere, bú Shelumiel nwa Zurishadai, wetara ihe-ya nso:
37 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
38 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
39 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
40 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
41 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Shelumiel nwa Zurishadai.
42 N'ubọchi nke-isi onye-isi umu Gad nwere, bú Eliasaf nwa Deuel, wetara ihe-ya nso:
43 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
44 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure- ọku nēsì ísì utọ;
45 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
46 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
47 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliasaf nwa Deuel.
48 N'ubọchi nke-asa onye-isi umu Efraim nwere, bú Elishama nwa Amihud, wetara ihe-ya nso:
49 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
50 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
51 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
52 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
53 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elishama nwa Amihud.
54 N'ubọchi nke-asatọ onye-isi umu Manase nwere, bú Gameliel nwa Pedahzua, wetara ihe-ya nso:
55 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ iri na n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
56 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
57 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
58 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
59 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Gameliel nwa Pedahzua.
60 N'ubọchi nke-iteghete onye-isi umu Benjamin nwere, bú Abidan nwa Gideoni, wetara ihe-ya nso:
61 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
62 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;
63 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure ọku;
64 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
65 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Abidan nwa Gideoni.
66 N'ubọchi nke-iri onye-isi umu Dan nwere, bú Ahieza nwa Amishadai, wetara ihe-ya nso:
67 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù- ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
68 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
69 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu; nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
70 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie:
71 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahieza nwa Amishadai.
72 N'ubọchi nke iri-na-otù onye-isi umu Asha nwere, bú Pagiel nwa Ọkran, wetara ihe-ya nso:
73 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọlaọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
74 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
75 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
76 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
77 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Pagiel nwa Ọkran.
78 N'ubọchi nke-iri-na-abua onye-isi umu Naftali nwere, bú Ahira nwa Inan, wetara ihe-ya nso:
79 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
80 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputura n'ihe-nsure-ọku; nēsì ísì utọ;
81 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
82 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
83 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahira nwa Inan.
84 Nka bu onyinye nke ira ebe-ichu-àjà nye Chineke, n'ubọchi etere ya manu, site n'aka ndi-isi Israel: afere ọla-ọcha iri na abua, na ọkwa-nwusa ọla-ọcha iri na abua, na ngaji ọla-edo iri na abua:
85 afere ọla-ọcha ọ bula di ọgu shekel isi na iri n'ọtùtù, ọkwa-nwusa ọ bula di kwa ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù: ọla-ọcha nile nke ihe nile di nnù shekel isi n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di;
86 ngaji ọla-edo iri na abua ahu, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, ha di shekel iri shekel iri n'ọtùtù-ha, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ọla-edo nile nke ngaji di ọgu shekel isi n'ọtùtù-ha:
87 ehi nile iji chu àjà-nsure-ọku di oke-ehi iri na abua, ebulu-ya di iri na abua, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di iri na abua, na onyinye-inata-iru-ọma-ha: nkpi iji chu àjà-nmehie di iri na abua:
88 ehi nile nke ihe àjà nke àjà-udo di orú oke-ehi na anọ, ebulu-ya di ọgu atọ, nkpi-ya di ọgu atọ, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di ọgu atọ. Nka bu onyinye nke irara ebe-ichu-àjà nye Chineke, mb͕e etesiri ya manu.
89 Ma mb͕e Moses bara n'ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n'etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.