Ọnu-Ọgugu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 21

Onye Kenean, bú eze Arad, onye bi na Negeb, we nu na Israel abiawo n'uzọ Atarim; ọ we buso Israel agha, dọta ufọdu nime ha n'agha.
2 Israel we kwere Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye ndi nka n'akam n'ezie, m'gēwezuga kwa obodo-ha nile ka ebibie ha.
3 Jehova we ge nti n'olu Israel, nye ndi Kenean n'aka-ha; ha we wezuga ha na obodo nile ha ka ebibie ha: ewe kpọ aha ebe ahu Họma.
4 Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije ga n'uzọ Oké Osimiri Uhie, iga ala Edom buruburu: ma nkpuru-obi ndi Israel enweghi ntachi-obi n'uzọ ahu.
5 Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé.
6 Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n'etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n'Israel.
7 Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel.
8 Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n'ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya.
9 Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya.
10 Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.
11 Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ọzara ahu nke di n'iru Moab, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.
12 Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Zered.
13 Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon, nke di n'ọzara, nke si n'ókè-ala ndi-Amorait aputa: n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab, n'etiti Moab na ndi-Amorait.
14 N'ihi ya ka anāsi n'akwukwọ agha di iche iche nke Jehova, Vaheb nime Sufa, Na ndagwurugwu nile nke Anon,
15 Na nkpọrube nke ndagwurugwu ahu, Bú nke nēwezuga onwe-ya n'uzọ ebe-obibi A, Nke nādabere kwa n'ókè-ala Moab.
16 Ha si n'ebe ahu jerue Bia: nke ahu bu olùlù-miri ahu nke Jehova gwara Moses okwu bayere ya, si, Chikọta ndim, M'gēnye kwa ha miri.
17 Mb͕e ahu Israel nābù abù a, si: Rigo, gi olùlù-miri; zanu ya:
18 Olùlù-miri, ndi-isi gwuru ya, Ndi amara aha-ha nke ndi Israel doziri ya, Ha ji nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru, ji kwa nkpa-n'aka nile ha, me ya. Ha si n'ọzara ahu jerue Matana:
19 si na Matana jerue Nahaliel: si na Nahaliel jerue Bamot:
20 si na Bamot jerue ndagwurugwu ahu nke di n'ọhia Moab, rue elu Pisga, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di.
21 Israel we ziga ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, si,
22 Ka m'gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi ba n'ọhia, ma-ọbu n'ubi-vine, ayi agaghi-aṅu miri olùlù-miri: n'uzọ eze ka ayi ganēje, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè- ala-gi.
23 Ma Saihon ekweghi ka Israel gabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, pua izute Israel rue ọzara, biarue Jehaz: ọ we buso Israel agha.
24 Israel we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, we nweta ala-ya site n'Anon rue Jekob, rue umu Amon: n'ihi na ókè-ala umu Amon siri ike.
25 Israel we were obodo ndia nile: Israel we biri n'obodo nile nke ndi-Amorait, nime Heshbon, na nime umu-obodo-ya nile.
26 N'ihi na Heshbon ahu, obodo Saihon, bú eze ndi-Amorait, ka ọ bu, eze ahu buso-kwa-rari eze gara aga Nke Moab agha, we nara ala-ya nile n'aka-ya, rue Anon.
27 N'ihi ya ndi nātu ilu nāsi, Banu nime Heshbon, Ka ewue obodo Saihon, ka eguzosi kwa ya ike:
28 N'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, Ire-ọku n'obodo Saihon: O ripiawo A nke Moab, Ndi-nwe ebe nile di elu nke Anon.
29 Ahuhu gādiri gi, Moab! I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh: Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu, Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha, N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait.
30 Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n'iyì rue Dibon, Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n'efu rue Nofa, Nke diruru Medeba.
31 Israel we biri n'ala ndi-Amorait.
32 Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n'ebe ahu ala-ha.
33 Ha we chigharia, rigo n'uzọ Bechan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha n'Edrei.
34 Jehova we si Moses, Atula egwu ya; n'ihi na ọ bu n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke biri nime Heshbon.
35 Ha we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru arapuru ya: ha we nweta ala-ya.