Ọnu-Ọgugu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 18

Jehova we si Eron, Gi onwe-gi na umu-gi ndikom na ulo nna-gi tiyere gi gēbu ajọ omume nke ebe nsọm: gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēbu kwa ajọ omume nke ọlu-nchu-àjà-unu.
2 Ọzọ kwa, umu-nne-gi, bú ebo Livai, ebo nna-gi, gi me ka ha soro gi biaru nso, ka ha we rapara n'aru-gi, nēje-kwa-ra gi ozi: ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gānọ n'iru ulo-ikwū ihe àmàm.
3 Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-gi, na ihe-ndebe nke Ulo-ikwūm nile: nání na ha agaghi-abiaru nso ihe nile nke ebe nsọm, ha agaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, ka ha we ghara inwu, ma ha, ma unu.
4 Ha gārapara kwa n'aru-gi, debe kwa ihe-ndebe nke ulo-ikwū nzute, nke diri òfùfè nile nke Ulo-ikwū ahu: ma onye ala ọzọ agaghi-abiaru nso unu.
5 Unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe nsọm, na ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjàm: ka iwe we ghara idikwasi umu Israel ọzọ.
6 Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were umu-nne-gi, bú ndi Livai: ha buru onyinye, ndi enyere Jehova, ifè òfùfè nke ulo-ikwū nzute.
7 Ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēdebe ọlu-nchu-àjà-unu bayere ihe nile nke ebe-ichu-àjàm, baye-kwa-ra ihe di nime ákwà-nb͕ochi; unu gēfè kwa: dika òfùfè nke onyinye ka M'nēnye unu ọlu-nchu-àjà-unu: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.
8 Jehova we gwa Eron okwu, si, Ma Mu onwem, le, enyewom i ihe-ndebe nke àjà-nbulim nile, bú nke diri ihe nile edoro nsọ nke umu Israel, gi ka M'nyeworo ha ibu òkè otite-manu, nye kwa umu-gi ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi.
9 Nka gābu nke gi site n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, site n'ọku: onyinye-ha ọ bula iji biaru nso, ọbuná onyinye-inata-iru-ọma-ha ọ bula, na àjà-nmehie-ha ọ bula, na àjà-ikpe-ọmuma-ha ọ bula, nke ha gēnyeghachim, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu gi, buru kwa umu-gi ndikom.
10 N'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka i gēri ya: nwoke ọ bula gēri ya; ihe nsọ ka ọ gāburu gi.
11 Nka bu kwa nke gi, àjà-nbuli nke onyinye-ha, ọbuná-àjà-ofufé nile nke umu Israel: gi ka M'nyeworo ha, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya.
12 Manu nile nke kachasi nma nke manu ọhu, na manya nile nke kachasi nma nke manya-vine ọhu, na ọka, bú ihe mbu ha nke ha nēnye Jehova, gi ka M'nyeworo ha.
13 Nkpuru mbu nke ihe nile di n'ala-ha, nke ha nēwetara Jehova, nke gi ka ọ bu; onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya.
14 Ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya n'Israel, nke gi ka ọ bu.
15 Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n'etiti madu na n'etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa.
16 Ma ndi-ha anāb͕aputa site na nke ruru otù ọnwa ka i gāb͕aputa, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, n'ọla-ọcha shekel ise, dika shekel nke ebe nsọm si di (orú gerah ka ọ bu).
17 Ma otú ọ di, nwa ehi buru uzọ mu, ma-ọbu nwa aturu buru uzọ mu, ma-ọbu nwa ewu buru uzọ mu, i gaghi-ab͕aputa ha; ihe nsọ ka ha bu: i gāwusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjàm, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku, ime ihe ísì utọ anēsurere Jehova.
18 Anu-ha bu kwa nke gi, dika okpukpu-obi nke àjà-ofufé, na dika utaku-ukwu aka-nri, nke gi ka ọ bu.
19 Àjà-nbuli nile nke ihe nsọ nile, nke umu Israel nēbuliri Jehova, ka M'nyeworo gi, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi: ọb͕ub͕a-ndu nnú ebighi-ebi n'iru Jehova ka ọ buru gi, buru kwa nkpuru-gi tiyere gi.
20 Jehova we si Eron, I gaghi-eketa ihe n'ala-ha, ọ dighi kwa òkè i gēnwe n'etiti ha: Mu onwem bu òkè-gi na ihe-nketa-gi n'etti umu Israel.
21 Ma umu Livai, le, ha ka M'nyeworo otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile n'Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute.
22 Ma umu Israel agaghi-abiaru nso ulo-ikwū nzute ahu ọzọ ibū nmehie, inwu anwu.
23 Ma ndi Livai gēfè òfùfè ahu nke ulo-ikwū nzute, ha onwe-ha gēbu kwa ajọ omume-ha: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu rue ọb͕ọ nile unu, ma n'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.
24 N'ihi na ọ bu otù uzọ n'uzọ iri nke ihe umu Israel, nke ha nēbuliri Jehova dika àjà-nbuli, ka M'nyeworo ndi Livai, ibu ihe-nketa: ya mere M'siworo ha, N'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.
25 Jehova we gwa Moses okwu, si,
26 I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n'aka umu Israel otù uzọ n'uzọ iri nke M'nyeworo unu site n'aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n'uzọ iri nke si n'otù uzọ n'uzọ iri ahu puta.
27 Agāgu-kwa-ra unu àjà-nbuli-unu, dika ọka nke si n'ebe-nzọcha-ọka puta, na dika ojuju-manya-vine nke si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine puta.
28 Otú a ka unu gēbuli, ọbuná unu onwe-unu, àjà-nbuli nke Jehova sitere n'otù uzọ n'uzọ iri nke ihe unu nile, nke unu nānara n'aka umu Israel; unu gēsi kwa na ya nye Eron, bú onye-nchu-àjà, àjà-nbuli nke Jehova.
29 Unu gēsi n'onyinye-unu nile bulie àjà-nbuli ọ bula nke Jehova, site n'ihe-ya nile kachasi nma, bú ihe nsọ ya sitere na ya.
30 I gāsi kwa ha, Mb͕e unu nēsi na ya bulie ihe-ya kachasi nma, agāgu-kwa-ra ndi Livai ya dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-ọka, na dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-nkpuru-vine.
31 Unu gēri kwa ya n'ebe ọ bula, unu onwe-unu na ulo nile unu: n'ihi na ugwọ-ọlu ka ọ buru unu, bú ihe-nkwughachi òfùfè-unu n'ulo-ikwū nzute.
32 Unu agaghēbu kwa nmehie bayere ya, mb͕e unu si na ya bulie ihe-ya kachasi nma: unu agaghi-emeru kwa ihe nsọ nile nke umu Israel, unu agaghi-anwu kwa.