Ọnu-Ọgugu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 24

Ma mb͕e Belam huru na ọ di nma n'anya Jehova igọzi Israel, ọ jeghi, dika o si eje ub͕ò ub͕ò, izute ọb͕ub͕a-afa di iche iche, ma o chere iru-ya n'ọzara.
2 Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n'ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya.
3 Ọ we tua ilu-ya, si, Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta, Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:
4 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke, Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile, Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:
5 Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob! Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!
6 Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha, Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri, Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo, Dika osisi cedar n'akuku miri.
7 Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa, Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri, Eze-ya gādi kwa elu kari Egag, Agēbuli kwa ala-eze-ya.
8 Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere: O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya, Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha, Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.
9 Ọ makpuru, o dinara dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie? Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi, Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.
10 Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia.
11 Ma ub͕u a, b͕alaga n'onwe-gi la n'ebe nke gi: asirim na m'gāsọpuru gi nke-uku; ma, le, Jehova eb͕ochiwo gi na nsọpuru.
12 Belam we si Belak, Ọ̀ bughi kwa ndi-ozi-gi, bú ndi i ziterem, ka m'gwara okwu, si,
13 Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu?
14 Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m'gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.
15 Ọ we tua ilu-ya, si, Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta, Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:
16 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke, Onye nāma kwa ihe-ọmuma nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile ka ọ nāhu, Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:
17 Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,
18 Edom gābu kwa ihe-nnweta, Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya; Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.
19 Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile, Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.
20 Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si, Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu; Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.
21 Ọ we hu ndi-Kinait, we tua ilu-ya, si, Ebe nke nādigide adigide ka ebe-obibi-gi di, Etiye-kwa-ra akwu-gi na nkume di elu.
22 Ma otú ọ di, Ken gābu ihe irechapu ọku, Rùe ole mb͕e? Asiria gādọta gi n'agha.
23 Ọ we tua ilu-ya, si, Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya?
24 Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia, Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala, Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì.
25 Belam we bilie, je, laghachi n'ebe-ya; ọzọ kwa, Belak jere n'uzọ-ya.