Ọnu-Ọgugu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 16

Ma Kora, nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, ya na Detan na Abairam, umu Eliab, na On, nwa Pelet, bú umu Reuben, chiri ndikom:
2 ha we bilie n'iru Moses, ha na ndikom ufọdu ndi sitere n'umu Israel, ọgu ndi isi nzukọ iri-na-abua na iri, ndi akpọrọ ibia na nzute, ndikom amara aha-ha:
3 ha we kpọkọta onwe-ha imegide Moses na imegide Eron, si ha, O zuworo unu, n'ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n'otù n'otù, di nsọ, ọ bu kwa n'etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bu kwa gini mere unu nēbuli onwe-unu kari nkpọkọta nke Jehova?
4 Moses we nu ya, we da kpue iru-ya n'ala:
5 o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.
6 Menu nka; chirinu n'onwe-unu ihe-igu-ọku, Kora, na nzukọ-ya nile;
7 tiye-kwa-nu ọku nime ha, tukwasi kwa n'elu ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova echi: ọ gēru kwa na nwoke ahu nke Jehova gārọputa, onye ahu bu onye nsọ: o zuworo unu, umu Livai.
8 Moses we si Kora, Biko, nurunu, umu Livai:
9 Ọ̀ bu unu ihe ntà na Chineke nke Israel akpawo ókè n'etiti unu na nzukọ Israel, ime ka unu biarue nso Ya; ifè òfùfè nke ebe-obibi Jehova, na iguzo n'iru nzukọ ahu ijere ha ozi;
10 Ọ we me ka i biarue nso, gi na umu-nne-gi niile, bú umu Livai? ùnu nācho kwa ọlu nchu-àjà?
11 N'ihi ya gi onwe-gi na nzukọ-gi nile bu ndi nēzukọ imegide Jehova: ma Eron, gini ka ọ bu na unu nātamu ntamu megide ya?
12 Moses we ziga ikpọ Detan na Abairam, bú umu Eliab: ha we si, Ayi agaghi-arigo:
13 ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n'ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi?
14 Ọzọ kwa, ọ bughi ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nēru nime ya ka i meworo ka ayi ba, i nyeghi kwa ayi ihe-nketa, bú ubi na ubi-vine: ì gārukpọ anya ndikom ndia? ayi agaghi-arigo.
15 Moses we we iwe di ọku nke-uku, ọ we si Jehova, Echela onyinye-inata-iru-ọma-ha iru: ọ dighi otù inyinya-ibu m'naraworo n'aka-ha, ọ dighi kwa otù onye nime ha M'mejọworo.
16 Moses we si Kora, Gi onwe-gi na nzukọ-gi nile nọ n'iru Jehova, gi, na ha, na Eron, echi:
17 chiri-kwa-nu, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye kwa ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ha, weta kwa-nu ha nso n'iru Jehova, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, ọgu ihe-igu-ọku iri-na-abua na iri; gi onwe-gi kwa, na Eron, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya.
18 Ha we chiri, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye ọku n'elu ha, tukwasi kwa ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, we guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ha na Moses na Eron.
19 Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya.
20 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
21 Kewapunu onwe-unu n'etiti nzukọ nka, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya.
22 Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?
23 Jehova we gwa Moses okwu, si,
24 Gwa nzukọ Israel okwu, si, Sinu na buruburu ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam rigo.
25 Moses we bilie, jekuru Detan na Abairam; ndi-okenye Israel we so ya.
26 o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n'ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile.
27 Ha we si n'ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam buruburu rigo: Detan na Abairam we puta, guzo onwe-ha n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ha, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ntakiri-ha.
28 Moses we si, Na nka ka unu gāmara na Jehova ezitewom ime omume ndia nile; n'ihi na ha esiteghi n'obim.
29 Ọ buru na ọnwu dika ọnwu madu nile ka ndia gānwu, ọ buru kwa na ọ bu nleta madu nile ka aga eleta ha; Jehova eziteghm.
30 Ma ọ buru na ihe-òkìkè ọhu ka Jehova gēkè, ala ewe saghepu ọnu-ya, loda ha, ha na ihe nile ha nwere, ha we rida na ndu rue ala-mọ; unu gāmara kwa na ndikom ndia elelìwo Jehova.
31 O rue, mb͕e o kwubiri okwu ndia nile, na ala nke di n'okpuru ha b͕awara:
32 ala we saghe ọnu-ya, loda ha, na ulo nile ha, na madu nile Kora nwere, na àkù-ha nile.
33 Ha we rida na ndu rue ala-mọ, ha onwe-ha na ihe nile ha nwere: ala we mechie n'elu ha, ha we si n'etiti nkpọkọta ahu la n'iyì.
34 Israel nile ndi nọ ha buruburu we b͕alaga n'olu ákwá-ha: n'ihi na ha siri, Ka ala we ghara iloda ayi.
35 Ọku we si n'ebe Jehova nọ puta, ripia ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu nēweta nso ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
36 Jehova we gwa Moses okwu, si,
37 Gwa Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, ka o si n'etiti nsure-ọku ahu chilie ihe-igu-ọku ahu, gi kposa kwa ọku ahu n'akuku ahu; n'ihi na ha di nsọ;
38 bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n'ihi na ha wetara ha nso n'iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama.
39 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we chiri ihe-igu-ọku ọla ahu, nke ndi ahu esurere ọku wetara nso, ha we tisa ha ka ha buru ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà:
40 iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses.
41 Ma nzukọ nile nke umu Israel tamuru ntamu n'echi-ya megide Moses megide kwa Eron, si, Unu onwe-unu emewo ka ndi nke Jehova nwua.
42 O rue, mb͕e akpọkọtara nzukọ ahu megide Moses megide kwa Eron, na ha chere iru n'ulo-ikwū nzute: ma, le, igwe-oji ahu kpuchiri ya, ewe hu ebube Jehova.
43 Moses na Eron we bia n'iru ulo-ikwū nzute.
44 Jehova we gwa Moses okwu, si,
45 Sinu n'etiti nzukọ a bilie, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya. Ha we da kpue iru-ha n'ala.
46 Moses we si Eron, Were ihe-igu-ọku-gi, tiye ọku n.elu-ya sitere n'elu ebe-ichu-àjà, tukwasi kwa ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, būru ya jekuru nzukọ Israel ngwa ngwa, kpuchiere ha nmehie-ha; n'ihi na iwe ahu esiwo n.iru Jehova puta; ihe-otiti ahu amalitewo.
47 Eron we were dika Moses kwuru, b͕abà n'etiti nkpọkọta ahu; ma, le, ihe-otiti ahu amalitewo n'etiti ndi Israel: ọ we tiye ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ, we kpuchiere ndi ahu nmehie-ha.
48 Ọ we guzo n'etiti ndi nwuru anwu na ndi di ndu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.
49 Ma ndi nwuru anwu n'ihe-otiti ahu di orú nnù na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise, nāgughi ndi nwuru anwu n'okwu Kora.
50 Eron we laghachikuru Moses rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.