Ọnu-Ọgugu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 19

Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
2 Nka bu ukpuru nke iwu ahu nke Jehova nyeworo n'iwu, si, Gwa umu Israel okwu, ka ha wetara gi nwa-ab͕ọghọ-ehi nācha uhie uhie nke zuru okè, nke ọlu nādighi n.aru-ya, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ya:
3 unu gēnye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ gēme ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, otù onye gēb͕u ya n'iru ya:
4 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, fesa ufọdu nime ọbara-ya na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ub͕ò asa:
5 otù onye gēsure kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu ọku n'anya-ya; akpukpọ-ya, na anu-ya, na ọbara-ya, tiyere nsi-ya, ka o gēsure ọku:
6 onye-nchu-àjà gēwere kwa osisi cedar, na hyssop, na ogho uhie, tubà ya n'etiti nsure-ọku nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu.
7 onye-nchu-àjà gāsu kwa uwe-ya, sa kwa anu-aru-ya na miri, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū, onye-nchu-àjà gāru kwa árú rue anyasi.
8 Onye ahu nke nēsure ya ọku gāsu kwa uwe-ya na miri, sa kwa anu-aru-ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
9 Nwoke nke di ọcha gāchikọta ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu, do ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū n'ebe di ọcha, ọ gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ndebe ibu miri nke idi-na-nsọ: àjà-nmehie ka ọ bu.
10 Onye ahu nke nāchikọta ntu nwa-ab͕ọghọ-ehi gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: ọ gābu-kwa-ra umu Israel, buru kwa ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, ukpuru ebighi-ebi.
11 Onye nēmetu ozu nwuru anwu nke madu ọ bula aru gāru árú ubọchi asa:
12 onye ahu gēwere ya wepu nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, n'ubọchi nke-asa ọ gādi kwa ọcha: ma ọ buru na o wepughi nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, ọ gaghi-adi kwa ọcha n'ubọchi nke-asa.
13 Onye ọ bula nke nēmetu onye nwuru anwu aru, bú ozu madu nke nwuru anwu, ma o wepughi nmehie-ya, ebe obibi Jehova ka ọ nēmeru; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'Israel n'ihi na awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka ọ gābu; ọrurú-ya nādikwasi ya rue ub͕u a.
14 Nka bu iwu mb͕e madu nwuru n'ulo-ikwū: onye ọ bula nke nāba n.ulo-ikwū ahu, na onye ọ bula nke nọ n'ulo-ikwū ahu, gāru árú ubọchi asa.
15 Ihe ọ bula nke ghere oghe, nke nēnweghi ihe-nkpuchi eriri eji kechi elu-ya, ihe ruru árú ka ọ bu.
16 Onye ọ bula nke nēmetu onye eji mma-agha b͕u, ma-ọbu onye nwuru anwu, ma-ọbu ọkpukpu madu, ma-ọbu ílì, aru, n'ọhia sara iru, ọ gāru árú ubọchi asa.
17 Ha gēwere kwa ufọdu nime ntu nsure-ọku àjà-nmehie ahu bayere onye ahu ruru árú, agētiye kwa miri nērù erù n'elu ya nime ihe:
18 nwoke nke di ọcha gēwere kwa hyssop, sue ya na miri ahu, fesa ya n'ulo-ikwū ahu, na n'ihe-ya nile, na n'aru ndi nọ n'ebe ahu, na n'aru onye ahu nke metuworo ọkpukpu ahu, maọbu onye eb͕uru eb͕u ahu, ma-ọbu onye nwuru anwu ahu, maọbu ílì ahu, aru:
19 onye ahu nke di ọcha gēfesa kwa onye ahu ruru árú n'ubọchi nke-atọ, na n'ubọchi nke-asa: ọ gēwepu kwa nmehie-ya n'ubọchi nke-asa; ọ gāsu kwa uwe-ya, sa kwa aru-ya na miri, di ọcha n'anyasi.
20 Ma nwoke nke ruru árú, ma ọ dighi-ewepu nmehie-ya, agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti nkpọkọta Israel, n'ihi na ọ bu nsọ Jehova ka ọ meruworo: awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka o bu.
21 Ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru ebighi-ebi; onye nēfesa miri nke idi-na-nsọ ahu gāsu kwa uwe-ya; onye nēmetu miri nke idi-na-nsọ ahu aru gāru kwa árú rue anyasi.
22 Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.