Ọnu-Ọgugu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 27

Ha we biarue nso, bú umu-ndinyom Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, nke ab͕uru Manase nwa Josef: ndia bu aha umu-ya ndinyom; Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.
2 Ha we guzo n'iru Moses, na n'iru Eleeza, bú onye-nchu-aja, na n'iru ndi-isi na nzukọ Israel nile, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, si,
3 Nna-ayi nwuru n'ọzara, ma ya onwe-ya adighi n'etiti nzukọ ahu ndi nēzukọ imegide Jehova nime nzukọ Kora: ma nime nmehie nke aka ya ka ọ nwuru: ma ọ dighi umu-ndikom o nwere.
4 N'ìhi gini ka agāgupu aha nna-ayi n'etiti ab͕uru-ya, n'ihi na o nweghi nwa-nwoke? Nye ayi ihe-onwunwe n'etiti umu-nne-nna-ayi ndikom.
5 Moses we weta ikpé-ha nso n'iru Jehova.
6 Jehova we gwa Moses okwu, si,
7 Ọ bu ihe ziri ezi ka umu-ndinyom Zelọfehad nēkwu: i ghaghi inye ha ihe-onwunwe nke ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha ndikom; i gēme kwa ka ihe-nketa nna-ha gabiga rue ha aka.
8 Ọ bu kwa umu Israel ka i gāgwa okwu, si, Mb͕e nwoke gānwu, ma o nweghi nwa-nwoke, unu gēme kwa ka ihe-nketa-ya gabiga rue nwa-ya nwayi aka.
9 Ma ọ buru na o nweghi nwa-nwayi, unu gēnye kwa umunne-ya ndikom ihe-nketa-ya.
10 Ma ọ buru na ọ nweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa umu-nne nna-ya ndikom ihe-nketa-ya.
11 Ma ọ buru na nna-ya enweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa onye-aru-ya nke di ya nso site n'ab͕uru-ya ihe-nketa-ya, ọ gēnweta kwa ya: ọ gābu-kwa-ra umu Israel ukpuru ikpé, dika Jehova nyere Moses iwu.
12 Jehova we si Moses, Rigo n'ugwu Abarim nka, hu kwa ala ahu nke M'nyeworo umu Israel.
13 Ma mb͕e i huworo ya, agāchikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ, ọbuná gi onwe-gi, dika achikọtara Eron, bú nwa-nne-gi na umu-nna-ya:
14 n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum n'ọzara Zin, n'ise-okwu ahu nke nzukọ Israel, bú nke M'gwara unu me, idom nsọ na miri ahu n'anya-ha (Miri ahu bu miri Meriba Kedesh n'ọzara Zin.)
15 Moses we gwa Jehova okwu, si,
16 Ka Jehova, bú Chineke nke mọ anu-aru nile, bú madu, nwere, Ya me otù nwoke ka ọ buru onye-nlekọta nzukọ a,
17 onye ganāpu apu n'iru ha, onye ganābà kwa abà n'iru ha, onye ganēme kwa ka ha nāpu apu, onye ganēme kwa ka ha nābà abà; ka nzukọ Jehova we ghara idi ka ìgwè ewu na aturu nke nēnweghi onye-ọzùzù.
18 Jehova we si Moses, Kuru n'onwe-gi Joshua nwa Nun, bú nwoke nke Mọm di nime ya, bikwasi ya aka-gi;
19 guzo kwa ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọm nile; nye ya iwu n'anya-ha.
20 I gātukwasi kwa ya ufọdu nime ebube-gi, ka nzukọ nile nke umu Israel we nu.
21 Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile.
22 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: o we kuru Joshua, guzo ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọ Israel nile:
23 o we bikwasi ya aka-ya abua, nye kwa ya iwu, dika Jehova kwuru n'aka Moses.