Ọlu Ndi-Ozi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28


Isi 27

Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n'ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n'aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs.
2 Ayi we ba n'ub͕ọ Adramitiọm, nke gaje iga ebe di n'usọ oké osimiri nke Esia, we nupu, Aristakọs, onye Masedọnia nke Tesalọnaika, soro kwa ayi.
3 Ubọchi soni ayi we rue ala na Saidon: Juliọs we were obi-ọma mezie Pọl, kwere ka o jekuru ndi-eyì-ya ka ewe le ya anya nke-ọma.
4 Ayi we si n'ebe ahu nupu ub͕ọ, we nāga ala Saiprọs nso, n'ihi na ifufe nēfegide ayi.
5 Mb͕e ayi gabigasiri oké osimiri nke di n'akuku Silisia na Pamfilia, ayi we rue Maira, obodo nke Lisia.
6 N'ebe ahu ka ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise huru ub͕ọ Aleksandria nke nēje Itali; o we me ka ayi ba nime ya.
7 Mb͕e ayi gasiri nwayọ ọtutu ubọchi, mb͕e ọ di kwa ayi ike iru na ncherita-iru Naidọs, ebe ifufe nēkweghi ka ayi ga n'iru ọzọ, ayi we nāga ala Krit nso, na ncherita-iru Salmoni;
8 o we di ayi ike iga n'akuku ya, ayi we rue otù ebe anākpọ Ọnu-miri Ọma; nke obodo Lasia di ya nso.
9 Ma mb͕e o ruru ọtutu oge, mb͕e ije-ub͕ọ di kwa egwu ub͕u a, n'ihi na ub͕u a ka oge Obubu-ọnu gasiri, Pọl we dọ ha aka na nti,
10 si ha, Ndikom, ahuwom na nbibi na oké iyì gaje idi n'ije-ub͕ọ a, ọ bughi nání nke ihe ub͕ọ nēbu na ub͕ọ onwe-ya, ma nke ndu-ayi kwa.
11 Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise kweyere onye-isi ub͕ọ na onye nwe ub͕ọ, kari okwu Pọl kwuru.
12 Ebe ọnu-miri ahu nādighi n'ebe di nma inogide na mb͕e oyi, ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha we du ọdú ka enupu ub͕ọ n'ebe ahu, ma eleghi anya ha gēru Finiks, we nọgide n'ebe ahu na mb͕e oyi; nke bu otù ọnu-miri nke Krit, nke nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu n'akuku Ugwu na akuku Ndida.
13 Mb͕e ifufe nēfe nwayọ, ebe ha chère na ihe ha nēzube eruwo ha aka, ha we pua nāga n'akuku Krit.
14 Ma mb͕e ogologo oge akāgaghi, oké ifufe jọb͕uru onwe-ya nke anākpọ Yurakwilo, we si n'ebe ahu fedata:
15 mb͕e ifufe ahu napuru ayi ub͕ọ, mb͕e ub͕ọ apughi kwa ichegide ifufe ahu, ayi we rapu aka, ewe nēfeghari ayi.
16 Ma ebe ayi b͕ara ọsọ rue agwe-etiti ntà nso anākpọ Klọda, ayi we nwe ike ijide ub͕ọ ntà ayi, ma ọ di ayi ike:
17 mb͕e ha dọlitesiri ya elu, ha we chiri udọ̀ ime ka ub͕ọ-ayi sie ike, nēkebiga ya n'okpuru: ebe ha nātu egwu na agātubà ha na Satis ma eleghi anya, ha we dọda ákwà-ifufe, ewe nēfeghari ha otú a.
18 Mb͕e ifufe nēfegidesi ayi ike, ubọchi soni ha we tufube ihe ub͕ọ nēbu;
19 n'ubọchi nke-atọ ha we were aka-ha kpofue ihe ub͕ọ.
20 Ma mb͕e ọ nādighi anyanwu ma-ọbu kpakpando nāmukwasi ayi ọtutu ubọchi, mb͕e ọ dighi kwa oké ifufe ntà nēfekwasi ayi, ewe wepu olile-anya nile na agāzọputa ayi site n'ub͕u a.
21 Mb͕e ha nọdusiri rue oge di anya nērighi ihe, mb͕e ahu Pọl we guzo n'etiti ha, si, Ndikom, o kwesiri ka unu kweyerem, ghara kwa inupu ub͕ọ na Krit, na inwe nbibi a na iyì a.
22 Ub͕u a adọkwam unu aka na nti ka unu nwere obi-utọ: n'ihi na ọ dighi ntufu gādi n'etiti unu, kama ọ bu ntufu nke ub͕ọ.
23 N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a,
24 si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ.
25 N'ihi nka, ndikom, nwenu obi-utọ: n'ihi na ekwerem Chineke, na ọ gādi otú a ọbuná dika agwaworom.
26 Otú ọ di aghaghi itupu ayi n'elu otù agwe-etiti.
27 Ma mb͕e o ruru abali nke-iri-na-anọ, mb͕e ayi nērughari n'osimiri Adria, dika etiti abali ndi-ub͕ọ chère na ha nābiaru otù ala nso;
28 ha we tù oké osimiri, hu na ọ bu orú mbudu: mb͕e oge ntà gasiri, ha we tù ọzọ, hu mbudu iri na ise.
29 Ebe ha nātu egwu ma eleghi anya miri gātupu ayi n'ala nkume, ha we rada arilika anọ n'isi ub͕ọ, we kpe ekpere ka chi we bọ.
30 Mb͕e ndi-ub͕ọ nāchọ uzọ isi n'ub͕ọ b͕apu, mb͕e ha wedasi-kwa-ra ub͕ọ ntà n'oké osimiri, nēme dika ha gaje iseti arilika n'ọnu-ub͕ọ,
31 Pọl we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise na ndi-agha, Ọ buru na ndia anọgideghi n'ub͕ọ, apughi izọputa unu onwe-unu.
32 Mb͕e ahu ndi-agha bipuru udọ̀ ub͕ọ ntà ahu, we rapu ya ka ọ dapu.
33 Mb͕e chi gaje ibọ, Pọl we riọ ha nile ka ha rie nri, si Ta mere ya ubọchi nke-iri-na-anọ unu nēle anya, nọgide kwa n'ibū ọnu, ebe unu nērighi ihe.
34 N'ihi ya ariọm unu ka unu rie nri: n'ihi na nka diri nzọputa-unu: n'ihi na ọ dighi otù agiri-isi gēsi n'isi onye ọ bula n'etiti unu la n'iyì.
35 Mb͕e o kwusiri ihe ndia, nara kwa achicha, ọ kele Chineke n'iru madu nile: we nyawa ya, malite kwa iri ya.
36 Ha nile we nwe obi-utọ, ha onwe-ha we ri kwa nri.
37 Ayi nile ndi nọ n'ub͕ọ di ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na isi.
38 Mb͕e ha rijusiri afọ, ha me ka ub͕ọ di nfé, site n'itufu ọka n'oké osimiri.
39 Ma mb͕e chi bọrọ, ha amataghi ala ahu: ma ha huru otù ọnu-miri nke nwere ótú, ha we b͕a ìzù ma ha puru ime ka miri nubà ub͕ọ n'ala.
40 Mb͕e ha tupusiri arilika nile, rapu kwa ha n'oké osimiri, ha we tọpu udọ̀ umara isi-ub͕ọ n'otù oge ahu; ha we dọlie ákwà-ifufe nke ọnu-ub͕ọ nye ifufe, we jebe n'ótú.
41 Ma ebe ha dabàra n'otù ebe di n'ab͕ata oké osimiri abua, ha we tiye ub͕ọ n'ala; ọnu-ub͕ọ we siri n'ala digide kwa nēnweghi ike ka eropu ya, ma ike ebili-miri nyajibere isi-ub͕ọ.
42 Ma ọdú ndi-agha duru bu ka ha b͕ue ndi-nkpọrọ, ka onye ọ bula nime ha ghara isi n'ub͕ọ gwu miri, we b͕alaga.
43 Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, ebe o nēzube izọputa Pọl, o b͕ochiri ha n'ìzù-ha; we si ka ndi puru igwu miri si n'ub͕ọ tubà onwe-ha na miri, buru uzọ rue ala:
44 ka ndi fọduru ru kwa, ufọdu n'elu ibo, ndi ọzọ n'elu ihe di iche iche si n'ub͕ọ puta. Otú a o we rue, na azọputara madu nile, ha we rue ala.