Ọlu Ndi-Ozi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28


Isi 21

Ma mb͕e o ruru na ayi dọpusiri onwe-ayi n'ebe ha nọ, nupu kwa ub͕ọ, ayi gara otù iru je Kos, ubọchi so ya ayi we rue Rodes, we si n'ebe ahu je rue Patara:
2 ebe ayi huru ub͕o nke nāgabiga ofè Finisia, ayi we ba nime ya, we nupu.
3 Mb͕e ayi hugasiri Saiprọs anya, rapu kwa ya n'aka-ekpe, ayi we ga Siria, we pua n'ub͕ọ na Taia: n'ihi na ebe ahu ka ub͕ọ gaje ikwapu ihe di ya.
4 Mb͕e ayi chọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, ayi we nọgide n'ebe ahu ubọchi asa: ndi ahu we gwa Pọl site na Mọ Nsọ, ka ọ ghara izọbà ukwu na Jerusalem.
5 Ma mb͕e o ruru na ayi nọzuru ubọchi ahu, ayi pua ga ije; ha nile, ha na nwunye-ha, na umu-ha, we dupu ayi n'ije-ayi, rue azu obodo-ha: ayi we b͕ue ikperè n'ala n'ótú, kpere Chineke,
6 we kelerita ibe-ayi ekele ikpe-azu; ayi we ba n'ub͕ọ, ma ndi ahu laghachiri n'ulo-ha.
7 Mb͕e ayi onwe-ayi jedebesiri ije-ayi n'ub͕ọ site na Taia, ayi we rue Tọlemais; ayi we kele umu-nna nime Kraist, ayi na ha we nọgide otù ubọchi.
8 Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n'ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide.
9 Ma onye a nwere umu-nwanyi anọ, ndi nāmaghi nwoke, ndi nēbu amuma.
10 Mb͕e ayi nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, otù onye-amuma, aha-ya bu Agabọs, we si na Judia ridata.
11 O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n'aka ndi mba ọzọ.
12 Mb͕e ayi nuru ihe ndia, ayi we riọ ya, ma ayi onwe-ayi ma ndi ebe ahu, ka ọ ghara irigoro Jerusalem.
13 Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus.
14 Mb͕e ọ juru ikweye, ayi we kpuchie ọnu, si, Ka eme ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.
15 Mb͕e ubọchi ndia gasiri, ayi we kwakọ ihe-ayi, rigoro Jerusalem.
16 Ufọdu nime ndi nēso uzọ Jisus si na Sisaria so kwa ayi je, nēkuru otù Neson onye Saiprọs, onye sitere na mbu nēso uzọ Jisus, onye ayi gānọ n'ulo-ya dika ndi-ọbìa.
17 Mb͕e ayi ruru Jerusalem, umu-nna-ayi nime Kraist we were ọṅù nara ayi nke-ọma.
18 N'ubọchi soni Pọl soro ayi bakuru Jemes; ndi-okenye nile nọ kwa n'ebe ahu.
19 Mb͕e ọ kelerisi ha, o we kọ akukọ ihe nile n'otù n'otù nke Chineke lururi n'etiti ndi mba ọzọ site n'ije-ozi-ya.
20 Mb͕e ha nuru ya, ha we nye Chineke otuto, ha we si ya, Nwa-nna-ayi, i huwo ka ha ra, bú ọtutu madu riri nne n'etiti ndi-Ju ndi kweworo na Jisus; obi ha nile nānu kwa ọku nye iwu-ayi:
21 eji-kwa-ra okwu-ọnu zí ha ihe bayere gi, na i nēzí ndi-Ju nile ndi nọ n'etiti ndi mba ọzọ irapu Moses, ebe i nāgwa ha ka ha ghara ibì umu-ha úgwù, ka ha ghara kwa ijeso ọme-n'ala nile nke iwu-ayi.
22 Ọ̀ bu gini kwa? ha aghaghi inu na i biawo.
23 Ya mere, me nka nke ayi nāsi gi: Ayi nwere ndikom anọ ndi nkwa ha kwere Chineke di n'isi-ha;
24 kuru ndia tiyere onwe-gi, me ka gi na ha di ọcha, kwu-kwa-ra ha ugwọ ihe ha ji chu àjà, ka ha we kọpu isi: madu nile gāmara kwa na ezi-okwu adighi n'ihe ejiwo okwu-ọnu zí ha bayere gi; kama na gi onwe-gi nāgazi kwa, nēdebe iwu-ayi.
25 Ma ayi onwe-ayi zìri akwukwọ-ozi bayere ndi mba ọzọ ndi kweworo, nēnye iwu ka ha debe onwe-ha ghara imetu ihe achuru n'àjà nye arusi aka, ha na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko.
26 Mb͕e ahu Pọl kuru ndikom ahu tiyere onwe-ya, n'ubọchi so ya o we me ka ya na ha di ọcha, we ba n'ulo uku Chineke, nēgosi nmezu ubọchi nile nke anēme ka ha di ọcha, rue mb͕e echere n'iru Chineke onyinye ahu n'ihi madu nile n'otù n'otù nime ha.
27 Ma mb͕e ubọchi asa ahu gaje izu, ndi-Ju ndi si n'Esia bia, mb͕e ha huru ya n'ulo uku Chineke, ha me ka ìgwè madu ahu nile b͕a aghara, ha we dakwasi ya aka,
28 nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n'ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n'ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a.
29 N'ihi na ha buri uzọ hu ya na Trọfimọs onye Efesọs n'obodo, onye ha nēchè na Pọl dubatarari n'ulo uku Chineke.
30 Obodo ahu dum we me uṅara, ndi-Ju we b͕akọta: ha we jide Pọl, dọkpupu ya n'ulo uku Chineke: ngwa ngwa ewe mechie ọnu-uzọ nile.
31 Mb͕e ha nāchọ uzọ ib͕u ya, akukọ we rigo rue nti onye-isi-ọchi-agha nke òtù ndi-agha, na Jerusalem dum nāb͕a aghara.
32 Ngwa ngwa o we chiri ndi-agha na ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, we b͕adakwasi ha: mb͕e ha huru onye-isi-ọchi-agha na ndi-agha, ha we rapu iti Pọl ihe.
33 Mb͕e ahu onye-isi-ọchi-agha biaruru nso, jide ya, si ka ewere nkpọrọ abua ke ya; ọ ju-kwa-ra onye ọ bu, na ihe o mereri.
34 Ufọdu nime ìgwè madu ahu we ti nkpu otù ihe, ndi ọzọ ti kwa ihe ọzọ: ma mb͕e ọ nāpughi imata okwu di itukwasi obi n'ihi ùzù ahu, ọ si ka ekuru ya ba n'ulo ndi-agha.
35 Mb͕e o ruru n'elu ihe eji arigo, o rue na ndi-agha buru ya n'ihi ihe-ike nke ìgwè madu ahu;
36 n'ihi na ọra ndi-Ju nēso n'azu, nēti nkpu, si, Wepu ya.
37 Mb͕e agaje ikubà Pọl nime ulo ndi- agha, ọ si onye-isi-ọchi-agha, Ì gēkwe ka m'gwa gi okwu? O we si, Ì mara asusu Grik?
38 Gì onwe-gi abughi kwa onye Ijipt ahu, onye mb͕e ubọchi ndia akērughi kpaliri nnù ndikom iri ahu n'etiti Ndi-ob͕u-madu, dupu kwa ha ba nime ọhia?
39 Ma Pọl siri, Mu onwem bu onye-Ju, nke Tasọs nime Silisia, onye amuru n'obodo amara aha-ya: ariọkwam i, kwe ka m'gwa ndi-Ju okwu.
40 Mb͕e o kwere ya, Pọl ka o guzoro n'elu ihe eji arigo, o we kpukpue ndi-Ju aka; mb͕e emere ka ha nile kpuchie nọ̄ ọnu nke-uku, o we gwa ha okwu n'asusu Hibru, si,