Ọlu Ndi-Ozi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28


Isi 16

O we biaru kwa Dabe na Listra: ma le, otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ n'ebe ahu, aha-ya bu Timọti, nwa nke otù nwanyi Ju onye kwere na Jisus; ma nna-ya bu onye-Grik.
2 Umu-nna nime Kraist ndi bi na Listra na Aikọniọm b͕ara onye ahu ezi àmà.
3 Nwoke a ka Pọl chọrọ ka o so ya pua; o we were ya bì ya úgwù n'ihi ndi-Ju ndi nọ n'ebe ahu: n'ihi na ha nile matara na nna-ya bu onye-Grik.
4 Mb͕e ha nāgabiga n'obodo nile, ha we nēnye n'aka-ha iwu ahu idebe, bú nke ndi-ozi na ndi-okenye nọ na Jerusalem nyereri.
5 Ya mere anēnye nzukọ Kraist ike n'okwukwe-ayi, ọnu-ọgugu-ha nābabiga kwa uba ókè kwa-ubọchi.
6 Ha we nāgabiga n'ala Frijia na Galetia, ebe Mọ Nsọ b͕ochiri ha ikwu okwu Chineke n'Esia;
7 mb͕e ha biara na ncherita-iru Misia, ha we nwa iga na Bitinia; ma Mọ nke Jisus ekweghi ha;
8 ha we gabiga akuku Misia, we ridata na Troas.
9 Ewe me ka Pọl hu ọhù n'abali: Otù nwoke, bú onye Masedọnia, nēguzo, nāriọ ya, si, Gabita na Masedọnia, yere ayi aka.
10 Mb͕e ọ husiri ọhù ahu, ngwa ngwa ayi we chọ uzọ ipu ka ayi ba na Masedọnia, ebe ayi sikwutara n'obi-ayi na Chineke kpọrọ ayi-ri izì ha ozi ọma.
11 Ya mere ayi siri na Troas nupu ub͕ọ, we ga otù iru rue Samọtresi, n'echi-ya ayi we rue Neapọlis;
12 ayi we site n'ebe ahu ga rue Filipai, nke bu otù obodo nke Masedọnia, obodo mbu nke akuku ahu, buru kwa colony nke Rom: ayi we nānọgide n'obodo ahu ubọchi ufọdu.
13 N'ubọchi-izu-ike ayi we pua n'ọnu-uzọ-ama obodo ga n'usọ otù osimiri, ebe ayi chère na ebe ekpere di; ayi we nọdu ala, we gwa ndinyom ndi b͕akọrọ okwu.
14 Otù nwanyi we nu okwu-ayi, aha-ya bu Lidia, onye nēre ihe eji esiji ákwà ododo, onye obodo Tayataira, onye nātu egwu Chineke: Onye-nwe-ayi we meghe obi-ya, iṅa nti n'ihe nile Pọl nēkwu.
15 Mb͕e emere ya na èzí-na-ulo-ya baptism, ọ riọ ayi, si, Ọ buru na unu atulewo na abum onye kwere n'Onye-nwe-ayi, batanu n'ulom, nọgide n'ebe ahu. O we rugide ayi.
16 O we rue, mb͕e ayi nāga ebe ekpere, na otù nwa-ab͕ọghọ onye nwere mọ nke anākpọ Paiton zutere ayi, onye nēwetara ndi-nwe-ya ọtutu urù site n'ibu amuma ugha.
17 Nwanyi a nēso ayi na Pọl, nēti nkpu, si, Madu ndia bu ndi-orù Chineke Onye kachasi ihe nile elu, ndi nēkwusara unu uzọ nzọputa.
18 Ma nka ka ọ nēme ọtutu ubọchi. Ma Pọl, ebe ike gwuru ya nọ̄, o chighariri, si mọ ahu, Anamenye gi iwu n'aha Jisus Kraist ka i si nime ya puta. O we puta n'otù oge hour ahu.
19 Ma mb͕e ndi-nwe-ya huru na olile-anya nke urù-ha alawo, ha jidere Pọl na Sailas, we dọkpuru ha ba n'ọma-ahia n'iru ndi-isi,
20 mb͕e ha kutasiri ha n'iru ndi-ikpé, ha si, Ndikom ndia, ebe ha bu ndi-Ju, ha nēme ka obi lọ ndi obodo-ayi miri nke-uku,
21 ha nēkwusa kwa ọme-n'ala nke nēzighi ezi n'iwu ka ayi nara, ma-ọbu ime, ebe ayi bu ndi Rom.
22 Ìgwè ndi ahu we guzo ọtọ n'otù imegide ha: ndi-ikpé we dọwapu uwe-ha, nye kwa iwu ka apia ha utari.
23 Mb͕e ha tisiri ha ọtutu ihe-otiti, ha tubà ha n'ulo-nkpọrọ, nēnye onye-nche ulo-nkpọrọ iwu ka ọ debe ha nke-ọma:
24 onye, ebe enyere ya-ri iwu di otú a, ọ tubàra ha nime ulo-nkpọrọ di nime, kpọsie ha ọtọsi ike n'ukwu.
25 Ma dika n'etiti abali Pọl na Sailas nēkpe ekpere nābùku kwa Chineke abù, ndi-nkpọrọ we nēge nti n'olu-ha;
26 na mberede oké ala-ọma-jijiji di, nke mere ka ntọ-ala ulo-nkpọrọ ma jijiji: ngwa ngwa ọnu-uzọ nile we meghe; ab͕u ndi-nkpọrọ nile tọpu-kwa-ra.
27 Onye-nche ulo-nkpọrọ, ebe emere ka ọ teta n'ura, ebe ọ hu-kwa-ra ọnu-uzọ ulo-nkpọrọ ka ha megheworo, o we miputa mma-agha-ya, gaje ib͕u onwe-ya, ebe ọ nēchè na ndi-nkpọrọ ab͕apuwori.
28 Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n'ihi na ayi nile nọ n'ebe a.
29 O we riọ ka eweta ọku, o we mabà nime, da n'iru Pọl na Sailas, ka aru nāma ya jijiji,
30 o we kuputa ha, si, Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m'me ka ewe zọputam?
31 Ha we si, Kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi.
32 Ha we gwa ya okwu Onye-nwe-ayi, ya na ndi nile nọ n'ulo-ya.
33 O we kuru ha n'otù oge hour nke abali ahu, sa ọnyá ihe-otiti-ha; ngwa ngwa ewe me ya baptism, ya onwe-ya na ndi-ya nile.
34 O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke.
35 Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-ikpé zitere ndi-ọchi-utari-ha, si, Rapu ndikom ahu ka ha la.
36 Onye-nche ulo-nkpọrọ ahu we kọrọ Pọl okwu ndia, si, Ndi-ikpé ezitewo ka arapu unu la: ya mere putanu ub͕u a, la kwa n'udo.
37 Ma Pọl siri ha, Ha piara ayi ihe n'iru ọra madu, nāmaghi ayi ikpé, ọ bu ezie na ayi bu ndi Rom, ha we tubà ayi n'ulo-nkpọrọ; hà nāchupu kwa ayi ub͕u a na nzuzo? ha agaghi-eme ya ma-ọli; kama ka ha onwe-ha bia duputa ayi.
38 Ndi-ọchi-utari ahu we kọrọ ndi-ikpé okwu ndia: ha we tua egwu, mb͕e ha nuru na ha bu ndi Rom;
39 ha we bia riọ ha; mb͕e ha duputasiri ha, ha we kpere ha ka ha si n'obodo-ha pua.
40 Ha we si n'ulo-nkpọrọ-ahu puta, ba n'ulo Lidia: mb͕e ha husiri umu-nna nime Kraist, ha kasie ha obi, we pua.