Ọlu Ndi-Ozi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28


Isi 25

Ya mere Festọs, mb͕e ala ahu batasiri n'aka-ya, mb͕e ubọchi atọ gasiri o si na Sisaria rigoro Jerusalem.
2 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi n'etiti ndi-Ju we kọrọ ya akukọ megide Pọl; ha riọkwa-ra ya,
3 nāchọ amara imegide ha, ka ọ kpọta ya na Jerusalem; ebe ha nēche anwu ib͕u ya n'uzọ.
4 Otú ọ di, Festọs zara, si na anēdebe Pọl na Sisaria, si kwa na ya onwe-ya gaje ilaghachi ọsọsọ.
5 Ọ si, Ya mere, ka ndi ji ike n'etiti unu som rida, ọ buru kwa na ọ di ihe ọ bula nwoke ahu mehiere, ka ha bo ya ebubo.
6 Mb͕e ọ nọsiri n'etiti ha ihe nākaghi ubọchi asatọ ma-ọbu ubọchi iri, ọ ridata na Sisaria; echi-ya o we nọdu n'oche-ikpé-ya, we si ka ekuta Pọl.
7 Mb͕e ọ biaruru, ndi-Ju ndi siworo na Jerusalem ridata we guzo ya buruburu, nēbo ya ọtutu ebubo di arọ́, nke ha nēnweghi ike igosi;
8 Pọl nāgọpu kwa onwe-ya, si, Emehieghm ma-ọli megide iwu ndi-Ju, ma-ọbu imegide ulo uku Chineke, ma-ọbu imegide Sisa.
9 Ma Festọs, ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, ọ zara Pọl, si, Ì n'achọ irigoro Jerusalem, ka akpe gi ikpé banyere ihe ndia n'irum n'ebe ahu?
10 Ma Pọl siri, Anameguzo n'iru oche-ikpé nke Sisa, ebe aghaghi ikpem: emegideghm ndi-Ju ajọ omume ọ bula, dika gi onwe-gi mazu-kwa-ra nke-ọma.
11 Ya mere ọ buru na emem ajọ omume, ọ buru kwa na emewom ihe kwesiri ọnwu, ariọghm ib͕anari ọnwu: ma ọ buru na ọ dighi ihe bu ezi-okwu n'ebubo ndikom ndia nēbom, ọ dighi onye ọ bula puru iwerem nye ha n'amara. Ọ bu Sisa ka m'nākpọku.
12 Mb͕e ahu Festọs, mb͕e ya na nnọkọ-ikpé-ya b͕asiri ìzù, ọ zara, si, I kpọkuwo Sisa: ọ bu Sisa ka i gāgakuru.
13 Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, Agripa, bú eze, na Banaisi ruru Sisaria, kele kwa Festọs.
14 Mb͕e ha nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, Festọs we debe okwu bayere Pọl n'iru eze ahu, si, Otù nwoke di onye Filiks rapuworo n'ulo-nkpọrọ:
15 mb͕e m'nọ na Jerusalem, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we gwam okwu bayere ya, nāriọ ka ama ya ikpé.
16 M'we za ha, si, na ọ bughi ọme-n'ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n'iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n'ihe eboro ya.
17 Ya mere mb͕e ha biakọrọ n'otù n'ebe a, alaghm azu, ma ubọchi so ya m'nọduru n'oche-ikpé, si ka ekuta nwoke ahu.
18 Ma mb͕e ndi nēbo ya ebubo guzoro ọtọ, ha ejighi ihe ọ bula nime ihe ọjọ mu onwem chère we bo ya;
19 ma ha ji ajuju ufọdu megide ya bayere nsọpuru-chi nke aka ha, na ajuju bayere otù Jisus, Onye nwururi anwu, Onye Pọl nāsi na Ọ di ndu.
20 Ebe mu onwem nwere obi abua otú m'gāju ajuju bayere ihe ndia, m'we jua ma ọ chọrọ iga Jerusalem, ka ekpe kwa ya ikpé bayere ihe ndia n'ebe ahu.
21 Ma mb͕e Pọl kpọrọ ka edebe ya nye ntule Ọgustọs, m'we si ka edebe ya rue mb͕e m'gēziga ya jekuru Sisa.
22 Agripa we si Festọs, Ọ gādim nma ka mu onwem nuru kwa nwoke ahu. Ọ si, Echi ka i gānu ya.
23 Ya mere echi-ya, mb͕e Agripa biara, ya na Banaisi, n'oké ebube, bata kwa n'ulo ọnunu-okwu, ha na ndi-isi-ọchi-agha, na ndikom amara aha-ha n'obodo ahu, mb͕e Festọs kwuru ewe kuta Pọl.
24 Festọs we si, Eze Agripa, na ndikom nile ayi na unu nọ n'ebe a, unu ahuwo onye a, onye ọra ndi-Ju nile riọrọm aririọ bayere ya, ma na Jerusalem ma n'ebe a, nēti nkpu na ọ di nkpà ka ọ ghara idi ndu ọzọ.
25 Ma mu onwem huru na o meghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu: ma mb͕e ya onwe-ya kpọkuru Ọgustọs, m'we kpebìe iziga ya.
26 Ma enweghm okwu di itukwasi obi bayere ya idegara onye-nwem. N'ihi ya ekuputaram ya n'iru unu, ma nke ka n'iru gi onwe-gi, Eze Agripa, ka, mb͕e ekpesiri ya ikpé, ka m'we nwe ihe m'gēde n'akwukwo.
27 N'ihi na ọ dim ka ọ bu ihe uche nādighi ya, n'iziga onye-nkpọrọ, ka m'ghara igosi kwa ihe eboro ya.