Ọlu Ndi-Ozi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28


Isi 24

Mb͕e ubọchi ise gasiri onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we ridata, ya na ndi-okenye ufọdu, na otù onye-ọ̀kà-okwu, aha-ya bu Tatọlọs; ndi ahu we kọrọ onye-isi akukọ megide Pọl.
2 Mb͕e akpọrọ ya, Tatọlọs we malite ibo ya ebubo, si, Ebe ayi sitere n'aka-gi nwe udo ri nne, ebe esite-kwa-ra n'ezi uche, nke i ji buru uzọ zube ihe, nēmeziri mba nka ihe di iche iche,
3 ayi nānara ya nke-ọma n'uzọ nile na n'ebe nile, Filiks onye di oké ebube, ayi ji ekele nile.
4 Ma, ka m'ghara ime ka ike gwu gi kari, ariọm i ka i were obi-ọma-gi nuru okwu ole-na-ole n'ọnu-ayi.
5 N'ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n'etiti ndi-Ju nile n'elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret:
6 onye nwa-kwa-ra imeru ulo uku Chineke: onye ayi jide-kwa-ra:
7 Ma onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, biakwasiri ayi, we were aka ike naputa ya n'aka-ayi;
8 onye i gāpu imazu n'ọnu-ya okwu bayere ihe nile ndia, nke ayi onwe-ayi nēbo ya ebubo, mb͕e gi onwe-gi gēkpe ya ikpé.
9 Ndi-Ju we so kwa ya n'ebubo ahu nāsi na ihe ndia di otú a.
10 Mb͕e onye-isi ahu fesiri ya aka ikwu okwu, Pọl we za, si, Ebe m'mara na i bu onye-ikpé nye mba nka ọtutu arọ gara aga, ewerem obi-utọ nāgọpu onwem:
11 ebe i puru imazu na ọ karighi ubọchi iri na abua site na mb͕e m'rigoro ikpọ isi ala nye Chineke na Jerusalem:
12 ha ahughm kwa ka m'nāgwa madu ọ bula okwu ma-ọbu ikpaliri ìgwè madu nime ulo uku Chineke, ma-ọbu nime ulo-nzukọ, ma-ọbu nime obodo.
13 Ha apughi kwa igosi gi ihe ha nēbom ebubo ub͕u a.
14 Ma nka ka m'kwuputara gi, na dika Uzọ ahu si di nke ha nākpọ irọ-òtù, ọ bu otú a ka m'nēkpere Chineke nke nna-ayi-hà, ebe m'kwere ihe nile nke di ka iwu-ayi si di, nke edewo-kwa-ra n'akwukwọ ndi-amuma:
15 n'ihi na enwerem olile-anya n'ebe Chineke nọ, nke ndia onwe-ha nēche kwa, na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume na nke ndi ajọ omume kwa gaje idi.
16 Nime nka ka m'nārughari kwa arum uka inwe akọ-na-uche nādighi-asu ngọngọ n'ebe Chineke na madu nọ mb͕e ọ bula.
17 Ma mb͕e ọtutu arọ gasiri abiarurum iluru mba nkem ọlu ebere, na iche onyinye di iche iche n'iru Chineke:
18 mb͕e m'nēme ihe ndia ha hurum n'ulo uku Chineke mb͕e m'mesiri onwem ka m'di ọcha, mu na ìgwè madu ma-ọbu itu-ùzù adigh: ma ndi-Ju ufọdu ndi si n'Esia bia
19 ndi aghaghi inọ n'ebe a n'iru gi, na ibom ebubo, ọ buru na ha nwere ihe ọ bula imegidem.
20 Ma-ọbu ka ndia onwe-ha kwue ajọ omume ọ bula ha huru, mb͕e m'guzoro n'iru nnọkọ-ikpé-ha,
21 ma-ọbughi n'ihi otù nkpu a, nke m'tiri mb͕e m'guzoro n'etiti ha, si, Ọ bu ikpé bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu ka anēkpe mu onwem n'iru unu ta.
22 Ma ebe Filiks matara ihe bayere Uzọ Jisus nke-ọma kari, ọ gwa ha ka ha chere, si, Mb͕e ọ bula onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, gāridata, m'gātule okwu-unu.
23 O we nye ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise iwu ka edebe ya, ka eme kwa ka ihe diri ya nfé; ka aghara kwa ib͕ochi onye ọ bula nime ndi nke aka ya ijere ya ozi.
24 Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Filiks biaruru, ya na Drusila, nwunye nke aka ya, onye bu nwanyi Ju, o we kpọta Pọl, we nu okwu-ya bayere okwukwe nime Kraist Jisus.
25 Mb͕e ọ nēkwu okwu bayere ezi omume, na imerū ihe okè, na ikpé ahu nke gaje ibia, Filiks we tua egwu, o we za, si, Ga nke gi n'oge a; mb͕e m'nwere oge m'gākpọ kwa gi.
26 O nēle kwa anya na Pọl gēnye ya ego: n'ihi ya ọ nākpọta kwa ya ọtutu mb͕e, ya na ya nākparita kwa uka.
27 Ma mb͕e arọ abua b͕azuru, Pọsiọs Festọs nọchiri ọnọdu Filiks; ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, Filiks we rapu Pọl n'ab͕u.