Isi 62

N'ihi Zaion m'gaghi-edebe ọnum du, na n'ihi Jerusalem m'gaghi-anọ jū, rue mb͕e ezi omume-ya gāputa ihè dika onwu-maramara, nzọputa-ya kwa dika ọwa nke nēnwu enwu.
2 Mba di iche iche gāhu kwa ezi omume-gi, eze nile gāhu nsọpuru-gi: agākpọ kwa gi aha ọhu nke ọnu Jehova gāgu.
3 I gāghọ kwa okpu-eze nke ima-nma n'aka Jehova, na ákwà-ike-n'isi nke ala-eze n'ọbu-aka Chineke-gi.
4 Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.
5 N'ihi na dika nwa-okorọbia si aluru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, otú a ka umu-gi ndikom gālu gi: ọzọ, dika obi-utọ nke onye nālu nwunye ọhu nwere n'aru nwunye ọhu ya, otú a ka obi gātọ Chineke utọ n'aru gi.
6 N'elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M'doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du,
7 unu ekwe-kwa-la ka O dere du, rue mb͕e Ọ gēme ka Jerusalem guzosie ike, ru kwa mb͕e Ọ gēme ya ka ọ buru otuto n'uwa.
8 Jehova ewerewo aka-nri-Ya, were kwa ogwe-aka-Ya di ike, ṅua iyi, si, N'ezie M'gaghi-enye kwa ọka-gi ọzọ iburu ndi-iro-gi ihe-oriri ma-ọli; n'ezie umu ala ọzọ agaghi-aṅu kwa manya-vine ọhu gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu bayere ya:
9 kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n'ogige nsọm nile.
10 Gabiganu, gabiganu n'ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n'elu ndi nile di iche iche.
11 Le, Jehova emewo ka anuru ya rue nsọtu uwa, si, Sinu ada Zaion, Le, nzọputa-gi abiawo; le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya.
12 Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.