Isi 49

Genum nti, unu agwe-etiti; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi di iche iche, site n'ebe di anya: Jehova esitewo na mb͕e m'nọ n'afọ kpọm; site na mb͕e m'nọ n'afọ nnem ka O hotaworo aham:
2 O we me ka ọnum di ka mma-agha di nkọ, na ǹdò aka-Ya ka O zobeworom; O we me ka m'ghọ àmùmà, n'àkpà-àkú-Ya ka O zebeworom:
3 O we sim, Orùm ka i bu; gi Israel, onye ọ bu nime gi ka M'gēme Onwem ka M'ma nma.
4 Ma mu onwem siri, N'efu ka m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, n'ihi ihe tọb͕ọrọ n'efu na otù nku-ume ka m'meworo ka ikem gwusia: n'ezie ikpém di n'aka Jehova, ugwọ-ọlum di kwa n'aka Chinekem.
5 Ma ub͕u a Jehova siri, bú Onye kpuworom site n'afọ nnem iburu Ya orù, ime ka Jekob laghachikute Ya, ka ewe chikọta-kwa-ra Ya Israel: (anāsọpu-kwa-ram n'anya Jehova, Chinekem aghọwo ikem:)
6 O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.
7 Otú a ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa Israel na Onye Nsọ ya, siri onye madu nēleda, onye bu ihe-árú nke mba nka, onye bu orù ndi nāchi achi: Ndi-eze gāhu, we kpọ isi ala; n'ihi Jehova Nke kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye Nsọ nke Israel, Nke rọputaworo gi.
8 Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu;
9 nāsi ndi ekere ab͕u, Puanu; nāsi ndi nọ n'ọchichiri, Putanu n'ìhè. N'uzọ nile ka ha gāzù onwe-ha, ọ bu kwa n'ugwu nile ọhia nādighi ka ebe-ita-nri-ha gādi.
10 Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.
11 M'gēme kwa ka ugwum nile ghọ uzọ, agēme kwa ka uzọm nile atuliri atuli di elu.
12 Le, ndia gēsi n'ebe di anya bia: le kwa, ndia gēsi n'Ugwu na n'Ọdida-anyanwu; ndia gēsi kwa n'ala Sainim.
13 Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.
14 Ma Zaion siri, Jehova arapuwom, Onye-nwe-ayi echezọwokwam.
15 Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.
16 Le, n'ọbu-akam abua ka M'kàworo gi àkà; mb͕idi-gi nile di n'irum mb͕e nile.
17 Umu-gi emewo ngwa; ndi nākwada gi na ndi nēme ka i tọb͕ọrọ n'efu gēsi nime gi pua.
18 Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta,) n'ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu.
19 N'ihi na, nkpọnkpọ ebe-gi nile na ebe-gi nile tọb͕ọrọ n'efu na ala-gi akwadara akwada, n'ezie ub͕u a i gādikara ndi bi n'ala nkpà, ndi nēloda gi gānọ kwa n'ebe di anya.
20 Umu nke mb͕e ọb͕ub͕a-aka-umu-gi gāsi kwa na nti-gi abua ọzọ, Ebe a dim nkpà: nyem ọnọdu ka m'we biri.
21 I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?
22 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, M'gēweliri mba nile akam, ọ bu kwa ndi di iche iche ka m'gēbuliri ọkọlọtọm: ha gēkuta kwa umu-gi ndikom n'obi-ha, agēbu kwa umu-gi ndinyom n'ubu-ha.
23 Ndi-eze gābu kwa nna nāzù umu-gi, ndi-eze-nwanyi-ha gābu kwa ndinyom nēnye umu-gi ara: ha gākpọ isi ala nye gi, kpue iru-ha n'ala, racha ájá ukwu-gi abua; i we mara na Mu onwem bu Jehova, Onye ihere agaghi-eme ndi nēle anyam.
24 Àgānara dike ihe o wetara n'agha, ma-ọbu ndi onye ezi omume dọtara n'agha, àgēme ka ha wepuga onwe-ha?
25 Ma otú a ka Jehova siri, Ọbuná ndi dike dọtara n'agha ka agēwepu, ọzọ, ihe onye nēme ka madu ma jijiji wetara n'agha, agēme ya ka ọ wepuga onwe-ya; ọ bu kwa onye nāluso gi ọ̀gù, ọ bu kwa umu-gi ka Mu onwem gāzọputa.
26 M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.