Isi 4

Ọzọ, ndinyom asa gējide otù nwoke n'ubọchi ahu, si Nri nke aka ayi ka ayi gēri, uwe nke aka ayi ka ayi gēyi kwa: ọ bu nání na agākpọkwasi ayi aha-gi; gi wepu ita-uta-ayi.
2 N'ubọchi ahu ka ihe-opupú nke Jehova gāghọ ihe mara nma na ihe-nsọpuru, nkpuru nke ala gāghọ-kwa-ra ndi Israel b͕apuru ab͕apu nbili-elu na ima-nma.
3 O gēru kwa, na onye emeworo ka ọ fọdu na Zaion, na onye fọduru na Jeruzalem, onye nsọ ka agākpọ ya, bú onye ọ bula nke edeworo ya n'akwukwọ idi ndu nime Jerusalem:
4 mb͕e Onye-nwe-ayi gāsachapuwori inyi umu-ndinyom Zaion, ṅachapu kwa ọbara Jerusalem n'etiti ya, site na Mọ nke ikpé, na site na Mọ nke nkpochapu.
5 Jehova gēkè kwa n'elu ebe ahu nile guzosiri ike nke ugwu Zaion, na n'elu nkpọkọta-ya nile, igwe-oji na anwuru-ọku n'ehihie, na onwunwu nke ọku nēre ere n'abali: n'ihi na n'elu ebube nile ka agāb͕asa ihe-nkpuchi.
6 Ulo-ntu gādi kwa ibu ǹdò n'ehihie ipu n'okpom-ọku, na ibu ebe-nb͕abà, na ibu ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo na ipu na miri-ozuzo nile.