Isi 59

Le, aka Jehova adighi nkpunkpu kari izọputa; nti-Ya adighi kwa arọ́ kari inu ihe:
2 kama ajọ omume nile unu aghọwo ihe nākpa ókè n'etiti unu na Chineke-unu, nmehie nile unu ezonariwo kwa unu iru-Ya, O we ghara inu.
3 N'ihi na ejiwo ọbara meru aka-unu, ejiwo kwa ajọ omume meru nkpisi-aka-unu; eb͕ub͕ere-ọnu-unu ekwuwo okwu-ugha, ire-unu nātamu ajọ ihe.
4 Ọ dighi onye nākpọ madu eje ikpé n'ezi omume, ọ dighi kwa onye nēji ikwesi-ntukwasi-obi eje ikpé: ha nātukwasi obi n'ihe tọb͕ọrọ n'efu, ha nēkwu kwa okwu-ugha; ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe.
5 Àkwá ubí ka ha buworo, ọ bu kwa ulo ududo ka ha nātu: onye ahu nke nēri àkwá-ha gānwu, ọzọ, nke anāzọpia gāb͕awaputa aju-ala.
6 Ulo-ududo-ha agaghi-aghọ uwe, ha agaghi-eji kwa ọlu di iche iche ha kpuchie onwe-ha: ọlu nile ha bu ọlu ajọ ihe, omume nke ihe-ike di kwa n'aka-ha.
7 Ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: èchìchè nile ha bu èchìchè ajọ ihe; nbibi na ntipia di n'okporo-uzọ nile nke ha.
8 Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n'uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo.
9 N'ihi ya ikpé nke ziri ezi adiwo anya n'ebe ayi nọ, ezi omume adighi-eru kwa ayi aru: ayi nēle anya ìhè, ma le, ọ bu ọchichiri; ayi nēle anya onwunwu-ọku, ma ọ bu n'oké ọchichiri ka ayi nējeghari.
10 Ayi nāsọghari ìsì na mb͕idi dika ndi-ìsì, e, ayi nāsọghari ìsì dika ndi nēnweghi anya: ayi asuwo ngọngọ n'etiti-ehihie dika ọ bu chi-ojiji; n'etiti ndi nwere ezi ndu ayi nọ ka ndi nwuru anwu.
11 Ayi nāb͕ọ uja dika bear, ayi nile, ọ bu kwa dika nduru ka ayi nēkwosi ákwá ike: ayi nēle anya ikpé ziri ezi, ma ọ digh: ayi nēle anya nzọputa, ma ọ di anya n'ebe ayi nọ.
12 N'ihi na njehie-ayi bara uba n'iru Gi, nmehie nile nke ayi azawo kwa megide ayi: n'ihi na ayi na njehie nile ayi nọkọ n'otù; ọzọ, ajọ omume nile ayi, ayi mara ha:
13 njehie, na igọnari Jehova, na isi n'iso Chineke-ayi laghachi azu, na ikwu okwu nmeb͕u na nwezuga, na ime okwu-ugha nile site n'obi-ayi, na ikwuputa ha.
14 Emewo kwa ka ikpe ziri ezi laghachi azu, ezi omume nēguzo kwa n'ebe di anya: n'ihi na ezi-okwu asuwo ngọngọ n'amá, izi-ezi apughi kwa ibata.
15 E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n'anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi.
16 O we hu na ọ dighi onye ọ bula di; ibobo we nwua Ya n'aru na ọ dighi onye nāriọrọ ayi aririọ: ogwe-aka-Ya we wetara Ya nzọputa; ezi omume-Ya kwa, nke ahu nākwagide Ya.
17 O we yiri ezi omume dika uwe-agha, kpu kwa okpu-agha nzọputa n'isi-Ya; O yiri kwa uwe nile nke ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ha buru uwe-oyiyi-Ya, O were ekworo kpuchie Onwe-ya dika uwe-nwuda.
18 Dika nmeso nile ha si di, otú a ka Ọ gākwughachi, ọnuma ka Ọ gākwughachi ndi nēmegide Ya, nmeso-ha ka Ọ gākwughachi ndi-iro-Ya; Ọ gākwughachi agwe-etiti nile nmeso-ha.
19 Ha gātu kwa egwu aha Jehova site n'Ọdida-anyanwu, tu kwa egwu ebube-Ya site n'ọwuwa anyanwu: mb͕e onye-nkpab͕u gābata dika miri-iyi, Mọ nke Jehova ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya.
20 Otù onye-nb͕aputa gābiaru kwa Zaion, biakute ndi nēsi na njehie chigharia nime Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
21 Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.