Isi 12

I gāsi kwa n'ubọchi ahu, M'gēkele Gi, Jehova; N'ihi na ọ bu ezie na I wesaram iwe, ma iwe-Gi alaghachiwo azu, I we kasiem obi.
2 Le, Chineke bu nzọputam; m'gātukwasi Ya obi, ghara itu egwu: n'ihi na ikem na abù ọmam ka Ja JEHOVA bu; O we ghọrọm nzọputa.
3 Unu gēji kwa obi-utọ seputa miri n'isi-iyi nile nke nzọputa.
4 Unu gāsi kwa n'ubọchi ahu, Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya, menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche, hotanu na emewo ka aha-Ya di elu.
5 Bùkuenu Jehova abù ọma; n'ihi na ihe-ọkaka ka O meworo: emewo ka amara nka n'uwa nile.
6 Tisie nkpu ike, kpọ nkpu ọṅù, gi nwanyi bi na Zaion n'ihi na onye uku n'etiti gi ka Onye Nsọ nke Israel bu.