Hosea

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14


Isi 7

Mb͕e M'gāgwọ Israel, mb͕e ahu ka ekpughere ajọ omume Efraim, na ihe ọjọ nile nke Sameria; n'ihi na ha aluwo ọlu ugha: ọzọ, onye-ori nābà n'ulo, usu ndi nāpunara madu ihe amadewo kwa n'èzí.
2 Ma ha adighi-asi n'obi-ha na ọ bu ihe ọjọ nile ha ka M'chetaworo: ub͕u a ka omume nile ha b͕aworo ha buruburu; na ncherita-irum ka ha di.
3 Ha ji ihe ọjọ ha eme ka eze ṅuria, ji kwa okwu-ugha nile ha eme ka ndi-isi ṅuria.
4 Ha nile bu ndi nākwa iko; ha di ka ite-ọku uku nke osi-ite meworo ka ọ di ọku; ọ kwusiri ikpọnwu site na mb͕e edoziri utu ọka flour agwọrọ agwọ rue mb͕e emere ka o ko eko.
5 N'ubọchi eze-ayi ndi-isi jiri idi-ọku nke manya-vine ria ọria; o soro ndi nākwa emò setia aka-ya.
6 N'ihi na ha ebutewo obi-ha nso dika ite-ọku uku, mb͕e ha nēche anwu: ogologo abali nile ka osi-ite-ha nāraru ura; n'ututu ihe ahu nēre dika ọku nēnwu enwu.
7 Ha nile di ọku ka ite-ọku uku, ha ewe ripia ndi-ikpe-ha; ndi-eze nile ha adawo n'ala: ọ dighi onye nākpọkum n'etiti ha.
8 Efraim, n'etiti ndi nile di iche iche ka ya onwe-ya nāgwa onwe-ya ọgwa; Efraim aghọwo ob͕e achicha nke anātugharighi atughari.
9 Ndi ala ọzọ eripiawo ike-ya, ma ya onwe-ya amagh: e, efesawo ya isi-awọ, ma ya onwe-ya amaghi.
10 Npako Israel azawo kwa okwu n'iru ya: ma ha alaghachikuteghi Jehova, bú Chineke-ha, ha achọtaghi kwa Ya, n'ihe a nile.
11 Efraim we di ka nduru nēnweghi uche, ọ dighi obi amam-ihe o nwere: Ijipt ka ha kpọkuworo, Asiria ka ha jekuworo.
12 Mb͕e ha nēje M'gāb͕asa ub͕um n'aru ha; dika anu-ufe nke elu-igwe ka M'gēme ka ha rida: M'gādọ ha aka na nti, dika ihe nzukọ-ha nuworo.
13 Ahuhu diri ha! n'ihi na ha awafunariwom; nbibi diri ha! n'ihi na ha ejehiewo megidem: ọ bu ezie na Mu onwem nāb͕aputa ha, ma ha onwe-ha ekwuwo okwu-ugha di iche iche megidem.
14 Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.
15 Ọ bu ezie na Mu onwem adọwo ha aka na nti, me ka ogwe-aka-ha di ike, ma Mu ka ha nēchè ihe ọjọ megide.
16 Ha nālaghachi, ma ọ bughi Onye nọ n'elu ka ha nālaghachikute; ha di ka uta nāghọ aghughọ: ndi-isi-ha gāda site na mma-agha, site n'oké iwe nke ire-ha: nka bu ikwa-emò-ha n'ala Ijipt.