Hosea

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14


Isi 3

Jehova we sim, Je kwa, hu nwanyi n'anya nke iko huworo ya n'anya, nke bu kwa nwanyi aluru na nwunye nākwa iko, dika Jehova si ahu umu Israel n'anya, ọ bu ezie na ha onwe-ha nēche iru na chi ọzọ di iche iche, nāhu kwa mbadamba nkpuru-vine amiri ami n'anya.
2 M'we were ego ọla-ọcha iri na ise, na otù homer ọka barley, na nkera homer ọka barley, gotara ya onwem:
3 m'we si ya, Ọtutu ubọchi ka i gānọdurum; i gaghi-akwa iko, i gaghi-abu kwa nwan yi nke nwoke ọ bula: Mu onwem gādi kwa otú a n'ebe i nọ.
4 N'ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim:
5 emesia umu Israel gālata, chọ Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha; ha gēji kwa oké egwu biakute Jehova, biaru kwa idi-nma-Ya na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.