Hosea

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14


Isi 4

Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n'ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n'ala nka gēkpe, n'ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n'ala nka.
2 Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu.
3 N'ihi nka ka ala nka gēru újú, onye ọ bula nke bi nime ya gāta kwa aru, ya na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe; ọ bu kwa azù nile nke oké osimiri ka agēkpochapu.
4 Ma otú ọ di, ka onye ọ bula ghara ise okwu, ka onye ọ bula ghara kwa iba nba; n'ihi na ndi-gi di ka ndi nēseso onye-nchu-àjà okwu.
5 I gāsu kwa ngọngọ n'ehihie, ọzọ, onye-amuma gēso kwa gi su ngọngọ n'abali; M'gēme kwa ka nne-gi la n'iyì.
6 Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.
7 Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.
8 Nmehie ndim ka ha nēri, ọ bu kwa ajọ omume-ha ka ha nēbuli, onye ọ bula nkpuru-obi-ya, nye.
9 Ọ gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà: M'gēji kwa uzọ-ya nile leta ya, ọ bukwa omume-ya nile ka M'gēnyeghachi ya.
10 Ha eriwo kwa ihe, ma afọ agaghi-eju ha; ha akwawo iko, ma ha agaghi-aba uba kari: n'ihi na ha arapuwo inu olu Jehova.
11 Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.
12 Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.
13 N'elu ugwu nile ka ha nāchu àjà, n'elu ugwu ntà nile ka ha nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'okpuru osisi oak na osisi poplar na osisi terebinth, n'ihi na ǹdò-ya di nma: n'ihi nka ka umu-unu ndinyom nākwa iko, ọ bu kwa n'ihi nka ka ndinyom unu luworo ọhu nākwa iko.
14 M'gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M'gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n'ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n'ala.
15 Ọ bu ezie na onye nākwa iko ka i bu, Israel, ma ka ikpe ghara ima Juda; unu abia-kwa-la na Gilgal, unu arigo-kwa-la na Bet-even, unu aṅu-kwa-la iyi, si, Jehova nādi ndu.
16 N'ihi na Israel ewezugawo onwe-ya, dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nēwezuga onwe-ya: ub͕u a ka Jehova gāzù ha dika nwa-aturu n'ebe sara mbara.
17 Onye ekekọtaworo n'arusi di iche iche ka Efraim bu; kwe ka ọ nọduru onwe-ya.
18 Iṅubiga-manya-ókè-ha ewezugawo onwe-ya: ha akwachiwo iko nti; ndi bu ọta-ha ahuwo ihere n'anya nke-uku.
19 Ifufe apiakọtawo ya na nkù-ya; ihere àjà nile ha gēme kwa ha.