Hosea

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14


Isi 5

Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa.
2 Ndi-njehie abamiwo n'ib͕u madu; ma mu onwem bu onye nādọ ha nile aka na nti.
3 Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.
4 Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi.
5 Npako Israel azawo kwa oku n'iru ya: Israel na Efraim gāsu kwa ngọngọ n'ajọ omume-ha; Juda esowo kwa ha su ngọngọ.
6 Ha gāchiri ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha je ichọ Jehova; ma ha agaghi-achọta Ya: O seputawo Onwe-ya n'aru ha.
7 Jehova ka ha ghọb͕uworo; n'ihi na umu nābughi nke Ya ka ha muworo: ub͕u a ka ọnwa ọhu gēripia ha, ha na òkè nile ha.
8 Fùanu opì-ike nime Gibea, Fùanu opì nime Rema: tienu nkpu agha nime Bet-even: n'azu gi, Benjamin.
9 Efraim gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'ubọchi iba-nba: n'etiti ebo nile nke Israel ka M'meworo ka amara ihe kwesiri ntukwasi-obi.
10 Ndi-isi Juda adiwo ka ndi nēwezuga ókè-ala: n'aru ha ka M'gāwukwasi nrubiga-ókè nke iwem dika miri.
11 Onye anēmeb͕u emeb͕u ka Efraim bu, ọ bu onye anāzọpia n'ikpé; n'ihi na o kwere ijeso ihe enyere n'iwu.
12 Ma Mu onwem, dika nla ka M'nādiri Efraim, dika ire-ure ka M'nādiri ulo Juda.
13 Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n'aru-unu la.
14 N'ihi na Mu onwem gādiri Efraim ka ọdum, di-kwa-ra ulo Juda ka nwa-ọdum: Mu onwem, ọbuná Mu Onwem gādọka, la; M'gēbupu, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.
15 M'gāla, lata n'ọnọdum, rue mb͕e ikpe gāma ha, ha we chọ irum: n'ahuhu-ha ka ha gāchọsim ike.