I. Ndi-Eze

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22


Isi 7

Ma Solomon nọ arọ iri na atọ n'iwu ulo nke aka ya, ọ we wubìe ulo-ya nile.
2 O we wue ulo oké ọhia Lebanon; ọgu cubit ise ka ogologo-ya di, ọgu cubit abua na iri ka obosara-ya di kwa, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di, ọ di n'elu akuku anọ nke ogidi osisi cedar, osisi cedar awara awa di kwa n'elu ogidi ahu.
3 Ewere osisi cedar kpuchie ya n'elu, n'elu ọgu ulo ntà nke akuku abua na ise, nke di n'elu ogidi; iri na ise n'otù akuku.
4 Ọnọdu window di kwa n'akuku atọ, ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.
5 Ọnu-uzọ nile na awara-uzọ nile nwere akuku anọ ra nrata, n'ọnọdu window: ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.
6 O me-kwa-ra uzọ-nbata nke ogidi; ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, orú cubit na iri ka obosara-ya di kwa; uzọ-nbata di kwa n'iru ha; ogidi na nbata-uzọ di kwa n'iru ha.
7 Ọ me-kwa-ra uzọ-nbata nke oche-eze ebe ọ ganēkpe ikpe, bú uzọ-nbata ikpé: ewere kwa osisi cedar kpuchie ya site n'ala ulo rue ala ulo.
8 Ma ulo-ya ebe o nēbi, bú ogige ọzọ nke di nime uzọ-nbata, ọ di ka ọlu a si di. O wu-kwa-ra ulo nye nwa-nwayi Fero, (bú nwayi nke Solomon luru na nwunye,) dika uzọ-nbata nka.
9 Eji nkume di oké ọnu-ahia wu ndia nile, bú nkume awara awa, dika ọtùtù si di, nkume eji mma-nkwọ kwọ, n'ime na n'èzí, bú site na ntọ-ala rue ndobi-ya, na n'èzí rue ogige uku ahu.
10 Ntọ-ala-ya bu kwa nkume di oké ọnu-ahia, bú nkume uku, nkume di cubit iri, na nkume di cubit asatọ.
11 Nkume nke di oké ọnu-ahia di kwa n'elu, dika ọtùtù nke osisi awara awa si di, na osisi cedar.
12 Ogige uku nke di buruburu nwe-kwa-ra akuku atọ nke nkume awara awa, na otù ariri nke osisi cedar awara awa; ọbuná dika ogige ime-ime ulo Jehova si enwe, na dika uzọ-nbata ulo si enwe.
13 Eze Solomon we ziga si na Taia kuputa Hairam.
14 Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n'ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n'amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n'ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile.
15 O we kpua ogidi ọla abua, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di: ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ogidi nke-abua buruburu.
16 O me-kwa-ra isi abua nke ọla awuru awu, itiye n'elu ogidi: cubit ise ka idi-elu otù isi di, cubit ise ka idi-elu isi nke-ọzọ di kwa.
17 Ihe-ọkpukpa, bú ihe emere ka ha yie ihe-ọkpukpa, na ihe aturu atu, bú ihe emere ka ha yie iyab͕a, diri isi nke di n'elu ogidi abua; asa diri otù isi, asa di-kwa-ra isi nke-ọzọ.
18 O me ogidi abua ahu; akuku abua dikwasi otù ihe-ọkpukpa buruburu, ikpuchi isi nke di n'elu pomegranate: otú a ka o me-kwa-ra isi nke-ọzọ.
19 Isi nke di n'elu ogidi n'uzọ-nbata ahu bu ihe emere ka ha yie urodi, cubit anọ.
20 Ma isi di kwa n'elu ogidi abua ahu n'elu, na ncherita-iru afọ nke di n'akuku ihe-ọkpukpa: pomegranate di ọgu iri, n'akuku nke dikwasi isi nke-ọzọ buruburu.
21 O guzo ogidi abua ahu n'uzọ-nbata nke ulo uku Chineke: o guzo ogidi aka-nri, kpọ aha-ya Jakin: o guzo ogidi aka-ekpe, kpọ aha-ya Boaz.
22 Ma n'elu ogidi ihe di nke emere ka o yie urodi: ewe luzue ọlu ogidi abua ahu.
23 O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di gburugburu gburugburu, cubit ise ka idi-elu-ya di: eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.
24 Afufa-ọhia di kwa n'okpuru ọnu-ya buruburu nke nāb͕a ya buruburu, iri di n'otù cubit, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu: afufa-ọhia ahu di ariri abua, awuru mb͕e awuru ya.
25 Ọ nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime.
26 Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: nnù bath ise ka ọ nānagide.
27 Ọ me ihe-ndọkwasi iri nke ọla; cubit anọ ka ogologo otù ihe-ndọkwasi di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa.
28 Ma nka bu otú emere ihe-ndọkwasi: ha nwere ihe-njikọ, bú ihe-njikọ n'etiti nkwukọta-ya:
29 ọdum na ehi na cherubim di n'ihe-njikọ nke di n'etiti nkwukọta ahu; ihe-ndọkwasi dikwasi na nkwukọta n'elu: ihe aturu atu nke emere ka o yie ihe-nkwuba di kwa n'okpuru ọdum nile na ehi nile.
30 Ihe-ndọkwasi ọ bula nwere wheel ọla anọ, na axle ọla: ukwu-ya anọ nwere ubu: n'okpuru ite ọsisa-miri ahu ka ubu ahu akpuru akpu di, n'akuku ihe aturu atu ọ bula.
31 Ọnu-ya nime isi-ya na n'elu di otù cubit: ọnu-ya di kwa buruburu, otú emere ihe-ndọkwasi, otù cubit na nkera cubit: ihe-ọpipi dikwasi kwa n'ọnu-ya, ihe-njikọ nile ha nwere akuku anọ ra nrata, ha adighi buruburu.
32 Wheel anọ ahu di n'okpuru ihe-njikọ: aka wheel di n'ihe-ndọkwasi: idi-elu otù wheel di otù cubit na nkera cubit.
33 Otú emere wheel nile di ka esi eme wheel ub͕ọ-ala: aka nile ha, na azu nile ha, na ihe nile nējikọta ha, na etiti nile ha, awuru ha nile awu.
34 Ubu anọ di na nkuku anọ nke ihe-ndọkwasi ọ bula: ubu-ya sitere n'ihe-ndọkwasi ahu.
35 Ihe di gburugburu gburugburu, nke idi-elu-ya di nkera cubit, di n'elu ihe-ndọkwasi ahu: aka-ya nile na ihe-njikọ-ya nile, nke di n'elu ihe-ndọkwasi ahu sitere na ya.
36 O b͕ue eb͕ub͕u cherubim na ọdum na nkwu n'elu mbadamba aka-ya nile, na n'elu ihe-njikọ-ya nile, dika ọnọdu di efu nke ebe ọ bula si di, ha na ihe aturu atu buruburu.
37 Otú a ka o mere ihe-ndọkwasi iri ahu: ha nile nwere otù ọwuwu, na otù ọtùtù, na otù ọpipi.
38 O me kwa ite ọsisa-miri iri nke ọla: ọgu bath abua ka otù ite ọsisa-miri nānagide: cubit anọ ka ite ọsisa-miri ọ bula di: otù ite ọsisa-miri di n'elu ihe-ndọkwasi ọ bula n'ihe-ndọkwasi iri ahu.
39 O tiye ihe-ndọkwasi ahu, ise n'akuku aka-nri ulo ahu, ise n'akuku aka-ekpe ulo ahu: o tiye kwa oké osimiri ahu n'akuku aka-nri ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu, na ncherita iru Ndida.
40 Hairam me-kwa-ra ite ọsisa-miri nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Hairam we jebìe ozi nile nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova:
41 ogidi abua ahu, na ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi;
42 na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú akuku pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi;
43 na ihe-ndọkwasi iri ahu, na ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;
44 na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru oké osimiri;
45 na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.
46 Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zaretan.
47 Solomon we dọba ihe ahu nile ghara itù ha, n'ihi na ha bara uba nke ukwu: achọputaghi ọtùtù ọla ahu.
48 Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Jehova: ebe-ichu-àjà ọla-edo, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ya, ọ bu ọla-edo:
49 na ihe-idọba-oriọna, ise n'aka-nri, ise n'aka-ekpe, n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo;
50 na iko nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na ihe-nkoye-ibo nile, ma nke diri ọnu-uzọ ime-ime ulo ahu, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, ma nke diri ọnu-uzọ ulo, bú ulo uku Chineke, ha bu ọla-edo.
51 Ewe jezue ozi nile nke eze, bú Solomon, jere n'ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o we tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Jehova.