I. Ndi-Eze

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22


Isi 12

Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru, ime ya eze.
2 O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nānọ n'Ijipt rue mb͕e ahu, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga, Jeroboam we biri n'Ijipt,
3 ha we ziga, kpọ ya;) na Jeroboam na nkpọkọta Israel nile biara, we gwa Rehoboam okwu, si,
4 Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a gi onwe-gi me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè.
5 Ọ si ha, Lanu rue ubọchi atọ ọzọ, laghachikutekwam. Ndi Israel we la.
6 Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon, bú nna-ya, mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?
7 Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka orù ta, we fè ha òfùfè, za ha, gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.
8 Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya.
9 Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi?
10 Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāgwa ha, si, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam.
11 Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.
12 Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutem n'ubọchi nke-atọ.
13 Eze we za ndi ahu okwu ike, rapu idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya;
14 o we gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.
15 Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Jehova, ka O we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Jehova gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.
16 Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n'ulo-ikwū-ha.
17 Ma umu Israel ndi bi n'obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha.
18 Eze, bú Rehoboam, we ziga Adoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; Israel nile we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ub͕ọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem.
19 Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta.
20 O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya.
21 Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda nile, na ebo Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso ulo Israel agha, iweghachiri Rehoboam nwa Solomon ala-eze.
22 Okwu Chineke we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,
23 Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa ulo nile nke Juda na Benjamin, gwa kwa ndi Israel fọduru, okwu, si,
24 Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu, bú umu Israel, agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, laghachi azu n'ulo-ha, dika okwu Jehova si di.
25 Jeroboam we wue Shekem n'ugwu Efraim, biri n'ebe ahu; o si n'ebe ahu pua, wue Penuel.
26 Jeroboam we si n'obi-ya, Ub͕u a ka ala-eze gālaghachikuru ulo Devid:
27 ọ buru na ndi nka arigo ichu àjà n'ulo Jehova na Jerusalem, obi ndi nka gālaghachikuru kwa onye-nwe-ha, bú Rehoboam eze Juda; ha gēb͕ukwam, laghachikuru Rehoboam, bú eze Juda.
28 Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.
29 Ọ dọba otù nime Bet-el, tiye nke-ọzọ nime Dan.
30 Ihe a we ghọ nmehie: ndi Israel we je n'iru otù nime ha, rue Dan.
31 O me ulo nke ebe di elu, me kwa ndi-nchu-àjà sitere n'ọnu-ọgugu ndi Israel nile, ndi nēsiteghi n'umu Livai.
32 Jeroboam we me ememe n'ọnwa nke-asatọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, dika ememe nke di na Juda, o we rigorue ebe-ichu-àjà ahu; otú a ka o mere na Bet-el, ichuru umu-ehi ahu, bú nke o mere, àjà: o guzo na Bet-el ndi-nchu-àjà nke ebe di elu nke o mere.
33 Ọ rigorue ebe-ichu-àjà nke o mere na Bet-el n'ubọchi nke-iri-na-ise n'ọnwa nke-asatọ, bú n'ọnwa nke ọ chèputara n'obi-ya: o we mere umu Israel ememe, rigorue ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.