I. Ndi-Eze

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22


Isi 18

O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na okwu Jehova ruru Elaija nti, n'arọ nke-atọ, si, Je, me ka Ehab hu gi anya; M'gēnye kwa miri-ozuzo n'elu uwa.
2 Elaija we je ime ka Ehab hu ya anya. Ma oké unwu ahu siri ike na Sameria.
3 Ehab we kpọ Obadaia, onye bu onye-isi ulo-ya. (Ma Obadaia nātu egwu Jehova nke-uku:
4 o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha.)
5 Ehab we si Obadaia, Jegharia n'ala, rue isi-iyi nile nke miri, ru kwa miri-iyi nile: eleghi anya ayi gāchọta ahihia, we me ka inyinya na inyinya mule di ndu, ka ayi we ghara ibipu anu n'anu-ulo-ayi.
6 Ha we kewara onwe-ha ala ahu igabiga nime ya: Ehab jere n'otù uzọ, nání ya, Obadaia je-kwa-ra n'uzọ ọzọ, nání ya.
7 Obadaia we nọ n'uzọ, ma, le, Elaija zutere ya: ọ mata ya, da kpue iru-ya n'ala, si, Ọ̀ bu gi bu nka, onye-nwem Elaija?
8 Ọ si ya, Mu ka ọ bu: je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.
9 Ọ si, Gini ka m'mehieworo, na gi onwe-gi nēnye orù-gi n'aka Ehab, ime ka m'nwua?
10 Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n'ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi.
11 Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.
12 Ọ gēru kwa, mb͕e mu onwem si n'ebe i nọ je, na Mọ nke Jehova gēburu gi jerue ebe m'nāmaghi; ma mb͕e m'biara igosi Ehab, ma ọ chọtaghi gi, ọ gēb͕ukwam: ma orù-gi nātu egwu Jehova site na mb͕e m'di na nwata.
13 Ègosighi onye-nwem ihe m'mere mb͕e Jezebel b͕uru ndi-amuma Jehova, na ezorom ọgu ndikom ise sitere na ndi-amuma Jehova, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, ogu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha?
14 Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo: ọ gēb͕ukwam.
15 Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie ta ka m'gēme ka ọ hum anya.
16 Obadaia we je izute Ehab, gosi ya: Ehab we je izute Elaija.
17 O rue, mb͕e Ehab huru Elaija, na Ehab siri ya, Ọ̀ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?
18 Ọ si, Emekpaghm Israel aru; kama ọ bu gi onwe-gi, na ulo nna-gi, nime nrapu unu rapuworo ihe nile Jehova nyere n'iwu, i we jeso Bealim.
19 Ma ub͕u a ziga, chikọtaram Israel nile rue ugwu Kamel, na ndi-amuma Beal, ndi di nnù madu na ọgu abua na iri, na ndi-amuma Ashera, ndi di nnù madu, ndi nēri ihe na table Jezebel.
20 Ehab we zisa ozi n'etiti umu Israel nile, chikọta ndi-amuma ahu rue ugwu Kamel.
21 Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n'etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula.
22 Elaija we si ndi Israel, Mu onwem, abum onye-amuma Jehova fọduru, náním; ma ndi-amuma Beal di nnù ndikom na ọgu abua na iri.
23 Ka ha nye kwa ayi oke-ehi abua; ka ha rọputa-kwa-ra onwe-ha otù oke-ehi, bọ ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú, ma ka ha ghara itiye ọku: mu onwem gēdozi kwa oke-ehi nke-ọzọ, tiye n'elu nkú, ma m'gaghi-etiye ọku.
24 Unu gākpọku kwa aha chi-unu, ma mu onwem gākpọku aha Jehova: ọ gēru kwa, na chi ahu nke nēwere ọku za, onye ahu bu Chineke. Ndi Israel nile we za, si, Ọ di nma, bú okwu a.
25 Elaija we si ndi-amuma Beal, Rọputaranu onwe-unu otù oke-ehi, buru uzọ dozie ya; n'ihi na unu onwe-unu di ọtutu; kpọku-kwa-nu aha chi-unu, ma unu etiyela ọku.
26 Ha we were oke-ehi nke enyere ha, ha we dozie ya, kpọkue aha Beal site n'ututu we rue etiti-ehihie, si, Beal, za ayi. Ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza. Ha we wukwasi n'elu ebe-ichu-àjà nke emere.
27 O rue, n'etiti-ehihie, na Elaija kwara ha emò, si, Werenu oké olu kpọ: n'ihi na chi ka ọ bu; n'ihi na ọ nātughari uche-ya, ma-ọbu na o wezugawo onwe-ya, ma-ọbu na ọ nọ n'ije, ma-ọbu eleghi anya ya onwe-ya nāraru ura, ma ọ gēteta.
28 Ha we were oké olu kpọ, were mma-agha na ube bìe aru onwe-ha dika ha si eme, rue mb͕e ọbara wukwasiri ha.
29 O rue, mb͕e etiti-ehihie gasiri, na ha nēbu amuma rue mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di.
30 Elaija we si ndi Israel nile, Biaruenu nsom; ndi Israel nile we biarue ya nso. O dozie ebe-ichu-àjà Jehova nke etipiara.
31 Elaija we chiri nkume iri na abua, dika ọnu-ọgugu ebo umu Jekob si di, bú onye okwu Jehova ruru nti, si, Israel gābu aha-gi.
32 Ọ chiri nkume ahu wue ebe-ichu-àjà n'aha Jehova; ọ me ebe miri gādọrọ, ra ka ebe gānagide mb͕é nkpuru-ọghigha abua, buruburu ebe-ichu-àjà.
33 O do nkú n'usoro, bọ oke-ehi-ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú. Ọ si, B͕ajuenu okpokoro anọ miri, wukwasi ya n'elu àjà-nsure-ọku, na n'elu nkú.
34 Ọ si, Menu ya nke ub͕ò abua; ha we me ya nke ub͕ò abua. Ọ si, Menu ya nke ub͕ò atọ; ha we me ya nke ub͕ò atọ.
35 Miri ahu we nērughari ebe-ichu-àjà ahu buruburu; ọ b͕aju kwa ebe ahu miri nādọrọ miri.
36 O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n'Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n'okwu-Gi ka m'meworo ihe nile ndia.
37 Zam, Jehova, zam, ka ndi nka we mara na Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke, na Gi onwe-gi echighariwo kwa obi-ha ilata.
38 Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n'ebe ahu miri dọrọ.
39 Ndi Israel nile we hu ya, da kpue iru-ha n'ala, si, Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke.
40 Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu.
41 Elaija we si Ehab, Rigo, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; n'ihi na olu ùzù oké miri-ozuzo nāda.
42 Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua.
43 Ọ si nwa-okorọbia-ya, Biko, rigo, legide anya n'uzọ oké osimiri. Ọ rigo, legide anya, si, Ọ dighi ihe ọ bula di. Ọ si, Jeghachi ub͕ò asa.
44 O rue, na nke ub͕ò asa, na ọ siri, Le, igwe-oji, nke di ntà dika ọbu-aka madu, nēsi n'oké osimiri rigoputa. Ọ si, Rigo, si Ehab, Dozie ub͕ọ-ala-gi, rida, ka miri-ozuzo we ghara ib͕ochi gi.
45 O rue, na nwa mb͕e ntà, na elu-igwe jiri nji n'igwe-oji na ifufe, oké miri-ozuzo di uku we di. Ehab we nọkwasi n'ub͕ọ-ala, la na Jezreel.
46 Aka Jehova we di n'aru Elaija; o we ke ihe-ọkiké n'úkwù-ya, b͕a ọsọ n'iru Ehab, rue ebe i nābà Jezreel.