I. Ndi-Eze

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22


Isi 17

Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.
2 Okwu Jehova we rue ya nti, si,
3 Si n'ebe a pua, chere onwe-gi iru n'Iru-anyanwu, zo onwe-gi na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan.
4 O gēru kwa, na i gāṅu miri sitere na miri-iyi ahu; ọ bu kwa ugolo-ọma ka M'nyeworo iwu izù gi n'ebe ahu.
5 O we je, me dika okwu Jehova si di: o je biri na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan.
6 Ugolo-ọma we nēbutere ya achicha na anu n'ututu, na achicha na anu n'anyasi; ọ nāṅu kwa miri sitere na miri-iyi ahu.
7 O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na miri-iyi ahu takọrọ, n'ihi na miri-ozuzo adighi n'ala.
8 Okwu Jehova we rue ya nti, si,
9 Bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n'ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di-ya nwuru nọ n'ebe ahu iwu izù gi.
10 O we bilie, je Zarefat, biarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, ma, le, n'ebe ahu ka nwayi di-ya nwuru nọ nāchikọta nkú: o we kpọ ya òkù, si, Biko, kuterem nwantī miri n'ihe, ka m'we ṅua.
11 O we je ikute ya, Elaija we kpọ ya òkù, si, Biko, wetaram iberibe achicha n'aka-gi.
12 Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua.
13 Elaija we si ya, Atula egwu; ba, mere dika okwu-gi si di: nání buru uzọ merem ob͕e achicha ntà site na ya, weputaram ya, ma mere onwe-gi, me-kwa-ra nwa-gi nwoke, n'ikpe-azu.
14 N'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Okpokoro utu ọka ahu agaghi-agwu, ite manu ahu agaghi-akọ gi kwa, rue ubọchi Jehova gēnye miri-ozuzo n'elu uwa.
15 O we je me dika okwu Elaija si di: nwayi ahu we rie, ya onwe-ya, na Elaija, na ulo-ya, ọtutu ubọchi.
16 Okpokoro utu ọka ahu agwughi, ite manu ahu akọghi kwa, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Elaija.
17 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwa nke nwayi ahu, bú nwayi nwe ulo, riara ọria; ọria-ya we di ike nke-uku, rue mb͕e ume nāfọdughi nime ya.
18 Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?
19 Ọ si ya, Nyem nwa-gi nwoke. O we kuputa ya n'obi-ya, kugo ya n'ime-ulo-elu, ebe ya onwe-ya nānọdu, ọ tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya.
20 Ọ kpọkue Jehova, si, Jehova, bú Chinekem, ọ̀ bu kwa nwayi a di-ya nwuru, nke mu onwem nānọ n'ulo-ya dika ọbìa, ka I mejọworo, n'ime ka nwa-ya nwoke nwua?
21 O setia onwe-ya n'aru nwata ahu ub͕ò atọ, kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, bú Chinekem, ka nkpuru-obi nwata nka biaghachi nime ya.
22 Jehova we ge nti olu Elaija; nkpuru-obi nwata ahu we biaghachi nime ya, ọ we di ndu.
23 Elaija we kuru nwata ahu, si n'ime-ulo-elu ahu kudata ya n'ulo, nye ya nne-ya: Elaija we si, Le, nwa-gi nādi ndu.
24 Nwayi ahu we si Elaija, Ub͕u a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n'ọnu-gi.