Deuteronomi
Isi 34
Moses we si n'ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue elu Pisga, nke di n'iru Jeriko. Jehova we me ka ọ hu ala ahu nile; Gilead, rue Dan; 
2 na Naftali nile, na ala nke Efraim na Manase, na ala nile nke Juda, rue oké osimiri nke di n'azu; 
3 na Negeb, na Buruburu-ala nke ndagwurugwu Jeriko, bú obodo nkwu, rue Zoa. 
4 Jehova we si ya, Nka bu ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Ọ bu nkpuru-gi ka M'gēnye ya: emewom ka i were anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-agabiga n'ebe ahu. 
5 Moses, bú orù Jehova, we nwua n'ebe ahu n'ala Moab, n'okwu-ọnu Jehova. 
6 O we lìe ya na ndagwurugwu ahu n'ala Moab na ncherita-iru Bet-peoa: ma ọ dighi onye mara ílì-ya rue ta. 
7 Moses b͕ara ọgu arọ isi mb͕e ọ nwuru: anya-ya adighi-ahu inyoghi-inyoghi, ume-ya apughi n'aru-ya. 
8 Umu Israel we kwara Moses ákwá n'ala ihe nādighi nke Moab orú ubọchi na iri: ubọchi nile nke ikwa-ákwá, bú oruru-újú Moses, we zue. 
9 Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; n'ihi na Moses ebikwasiwo ya aka-ya abua: umu Israel we ge ya nti, me kwa dika Jehova nyere Moses iwu. 
10 Ọ dighi kwa onye-amuma biliri ọzọ n'Israel dika Moses, onye Jehova mara iru na iru; 
11 bayere ihe-iriba-ama nile na ihe-ebube nile, nke Jehova zigara ya ime n'ala Ijipt, ime Fero, na ime ndi-orù-ya nile, na ime ala-ya nile; 
12 baye-kwa-ra aka ahu di ike nile, baye-kwa-ra ihe egwu uku ahu nile, nke Moses mere n'anya Israel nile.