Deuteronomi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34


Isi 18

Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bú ebo Livai nile, ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa ha gēsoro Israel nwe: àjà-ọku nile nke Jehova na ihe-nketa-Ya ka ha gēri.
2 Ọ dighi kwa ihe-nketa ha gēnwe n'etiti umu-nne-ha: Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwaworo ha.
3 Nka bu kwa ihe ekpeziri ka enye ndi-nchu-àjà site n'aka ndi Israel, bú site n'aka ndi nāchu àjà, ma ọ bu ehi-ma-ọbu aturu, na ha gēnye onye-nchu-àjà ọkwa-aka-ya, na ǹtì-ya abua, na okwurù-ya.
4 Ihe mbu nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na ihe mbu nke aji ìgwè ewu na aturu-gi, ka i gēnye ya.
5 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, arọputawo ya n'ebo-gi nile, iguzo ije ozi n'aha Jehova, ya onwe-ya na umu-ya ndikom ubọchi-gi nile.
6 Mb͕e onye Livai gābia site n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile site n'Israel nile, ebe ya onwe-ya nọ dika ọbìa, ọ we were agu nile nāgu nkpuru-obi-ya biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa;
7 ọ gēje kwa ozi n'aha Jehova, bú Chineke-ya, dika umu-nne-ya nile, bú ndi Livai, ndi nēguzo n'ebe ahu n'iru Jehova.
8 Òkè dika òkè-ya ka ha gēri, nāgughi ihe-ya nile erere nke o nwetara n'aka nna-ya-hà.
9 Mb͕e gi onwe-gi nābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, amutala ime dika ihe-árú nile nke mba ahu nile si di.
10 Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,
11 ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe.
12 N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi.
13 Onye zuru okè ka i gābu n'ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ.
14 N'ihi na mba ndia, nke gi onwe-gi gēnweta, nēge nti ndi nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, na ndi nāju ase: ma gi onwe-gi, ọ bughi otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.
15 Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka onye-amuma, nke di ka mu onwem, biliere gi site n'etiti gi, site n'umu-nne-gi; onye ahu ka unu gēge nti;
16 dika ihe nile si di nke i riọrọ n'aka Jehova, bú Chineke-gi, na Horeb n'ubọchi nkpọkọta ahu, si, Ka m'ghara inu kwa olu Jehova, bú Chinekem, ọzọ, ka m'ghara kwa ihu ọku uku a ọzọ, ka m'we ghara inwu.
17 Jehova we sim, Ha ekwuwo nke-ọma okwu nke ha kwuworo.
18 M'gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n'etiti umu-nne-ha; M'gētiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M'gēnye ya n'iwu.
19 O gēru kwa, na nwoke ọ bula nke nāgaghi-ege nti okwum nile nke ọ gēkwu n'aham, Mu onwem gājuta ya n'aka ya.
20 Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n'aham, nke M'nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n'aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa.
21 Mb͕e i gāsi n'obi-gi, Àyi gēsi aṅa mara okwu ahu nke Jehova nēkwughi?
22 Okwu nke onye-amuma nēkwu n'aha Jehova, ma okwu ahu emeghi, o reghi kwa; nke ahu bu okwu nke Jehova nēkwugh: na nganga ka onye-amuma ahu kwuworo ya, atula ujọ ya.