Deuteronomi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34


Isi 33

Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya.
2 Ọ we si, Jehova siri na Sainai bia, Si kwa na Sia walitere ha; O siri n'ugwu Peran nwuputa, O si-kwa-ra na ndi nsọ anāpughi iguta ọnu bia: Ọku di n'aka-nri-Ya, bú iwu enyere ha.
3 E, Ọ nāhu ndi nke Ya nile n'anya; Ndi nsọ Ya nile di n'aka-gi: Ndi ahu we nọdu ala n'ukwu-gi; Onye ọ bula gānata ufọdu nime okwu-gi.
4 Iwu ka Moses nyere ayi, Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.
5 Ọ we buru eze nime Jeshurun, Mb͕e ndi-isi ndi Israel chikọtara onwe ha, Ebo nile nke Israel n'otù.
6 Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu; Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.
7 Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si, Jehova, nu olu Juda, Me kwa ka ọ bakute ndi-ya: Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù; Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.
8 Ọ we kwue ihe bayere Livai, si, Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi, Onye I nwara na Masa, Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;
9 Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya; Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa; Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa; N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi, Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.
10 Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile, Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel: Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi, Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.
11 Jehova, gọzie àkù-ya, Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ: Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya, Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.
12 O kwuru ihe bayere Benjamin, si, Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya; O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.
13 Ọ we kwue ihe bayere Josef, si, Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu; Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi, Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru.
14 Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.
15 Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi.
16 Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya, Na obi-ọma nke Onye bi n'osisi ntà: Ka ngọzi ahu biakwasi n'isi Josef, Na n'opu-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.
17 Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.
18 Ọ we kwue ihe bayere Zebulun, si, Zebulun, ṅuria ọṅu n'ọpupu-gi; Isaka, ṅuri kwa ọṅu n'ulo-ikwū-gi nile.
19 Ha gākpọ ndi nile bia n'ugwu; N'ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume: N'ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara, Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n'ájá.
20 Ọ we kwue ihe bayere Gad, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara: Dika nne-ọdum ka ọ nēbi, Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi.
21 Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu, N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu; Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia, Ezi omume nke Jehova ka o mere, Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ.
22 O we kwue ihe bayere Dan, si, Dan bu nwa ọdum, Ọ nēsi na Beshan maputa.
23 O we kwue ihe bayere Naftali, si, Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi, Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova: Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida.
24 O we kwue ihe bayere Asha, si, Onye agọziri agọzi n'umu ka Asha bu; Ka ihe-ya tọ umu-nne-ya utọ, Ka ọ zọye kwa ukwu-ya na manu.
25 Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu; Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi.
26 Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun, Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n'iyere gi aka, Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya.
27 Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu, N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa: Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi, We si, Kpochapu.
28 Israel we biri na ntukwasi-obi, Isi-iyi Jekob nání ya iche, N'ala ọka na manya-vine ọhu; Ọzọ, elu-igwe-ya nātasi igirigi.
29 Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.