Deuteronomi
Isi 32
Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe;
Ka uwa nu kwa okwu ọnum:
2 Nmutam gātasi dika miri-ozuzo,
Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi;
Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu,
Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú:
3 N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa:
Nyenu Chineke-ayi idi-uku.
4 Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu:
N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi:
Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume,
Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu.
5 Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu.
Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ.
6 Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a,
Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe?
Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi?
Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike.
7 Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga,
Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ:
Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi;
Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.
8 Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha,
Mb͕e O kesara umu madu,
O guzoro ókè nile nke ndi nile
Dika ọnu-ọgugu umu Israel si di.
9 N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya;
Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya.
10 Ọ chọtara ya n'ala ọzara,
Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja.
Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe,
Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya:
11 Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya,
Nērughari n'elu umu-ya,
Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha,
Nēbu ha n'elu nkù-ya:
12 Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya,
Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya.
13 Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya,
Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi;
O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu,
Na manu site n'oké nkume ọ́mú;
14 Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu,
Ya na abuba umu-aturu,
Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu,
Tiyere abuba obi ọka wheat;
Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine.
15 Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu:
I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi:
O we rapu Chineke nke mere ya,
We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.
16 Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo,
Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe.
17 Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke,
Bú chi ha nāmaghi,
Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata,
Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ.
18 Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu,
I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi.
19 Jehova we hu ya, we lelia ha anya,
N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom.
20 O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ,
M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha:
N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu,
Umu ndi nēkwesighi okwukwe.
21 Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M'kwo ekworo;
Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe:
Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo;
Mba nzuzu ka M'gēwere kpasue ha iwe.
22 N'ihi na amuyewo ọku n'iwem,
Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala,
Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya,
Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.
23 M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ;
M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha:
24 Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo,
Ya na nbipu di ilu;
Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha,
Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.
25 Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí,
Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile;
Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,
Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.
26 Asiwom, M'gāfupu ha,
Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:
27 Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro,
Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie,
Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu,
Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.
28 N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu,
Nghọta adighi kwa nime ha.
29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,
Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!
30 Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,
Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,
Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,
Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?
31 N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi,
Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.
32 N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere,
Site kwa n'ubi Gọmọra:
Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí,
Uyọkọ di ilu ka ha nwere:
33 Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu,
Na ńsí di irè nke aju-ala.
34 Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ,
Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?
35 Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi,
Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu:
N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso,
Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.
36 N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya,
Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya;
Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo,
Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.
37 Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ?
Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;
38 Nke nēri abuba àjà nile ha,
Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha;
Ka ha bilie, yere unu aka,
Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu.
39 Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya,
Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ:
Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu;
M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike:
Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.
40 N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe,
We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,
41 Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà,
O buru kwa na akam ejide ikpé;
M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem,
M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.
42 M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè,
Mma-agham gēri kwa anu-aru;
Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha,
Site n'isi ndundu onye-iro.
43 Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu:
N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya,
Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya,
O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.
44 Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun.
45 Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia:
46 o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.
47 N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.
48 Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si,
49 Rigo n'ugwu a nke Abarim, bú ugwu Nebo, nke di n'ala Moab, nke di n'irú Jeriko; le kwa ala Kenean anya, bú nke Mu onwem nēnye umu Israel n'ihe-onwunwe:
50 gi nwu kwa n'ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n'ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ:
51 n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel.
52 N'ihi na ọ bu na ncherita-iru ka i gāhu ala ahu; ma i gaghi-abà n'ebe ahu n'ala ahu nke Mu onwem nēnye umu Israel.