Ezra

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10


Isi 9

Ma mb͕e emere ka ihe ndia gwusia, ndi-isi biarurum nso, si, Ndi Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, ha ekewapughi onwe-ha n'etiti ndi di iche iche nke ala ọzọ, nēme dika ihe-árú-ha si di, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi Amon, na ndi Moab, na ndi Ijipt, na ndi-Amorait.
2 N'ihi na ha esiwo n'umu-ha ndinyom lutara onwe-ha nwunye, luta-kwa-ra umu-ha ndikom; nkpuru nsọ ahu we gwakọta onwe-ha na ndi di iche iche nke ala ọzọ: ma aka ndi-isi na ndi nāchi ala bu uzọ na nmekpu a.
3 Ma mb͕e m'nuru okwu a, adọwaram uwem na uwe-nwudam, ropu kwa ufọdu n'agiri-isi nke isim na aji afu-ọnum, m'we nọdu, ibobo we nwuam n'aru.
4 Ewe chikọta n'ebe m'nọ onye ọ bula nke nāma jijiji n'okwu Chineke Israel, n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ; ma mu onwem nānọdu, ibobo we nwuam n'aru, rue mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.
5 Ma na mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, esirim n'iweda onwem n'ala bilie, ọbuná na ndọwa na uwe-nwudam; m'we ruru ala n'ikperèm b͕asara Jehova, bú Chinekem, ọbu-akam abua;
6 M'we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n'ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n'ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe.
7 Site n'ubọchi nna-ayi-hà ayi onwe-ayi anọwo n'ikpe-ọmuma uku rue ta; ma n'ihi ajọ omume nile ayi ka enyere ayi onwe-ayi, na ndi-eze-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, n'aka ndi-eze ala ọzọ, na mma-agha, na na ndọta-n'agha, na nime nluta-n'agha, na n'ihere iru, dika o si di ta.
8 Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n'aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n'ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n'ọbubu-orù-ayi.
9 N'ihi na ndi-orù ka ayi bu; ma Chineke-ayi arapughi ayi n'ọbubu-orù-ayi, kama O setiwo ebere rue ayi aru n'iru ndi-eze Peasia, idebere ayi ndu, iwuli ulo Chineke-ayi elu, na ime ka nkpọnkpọ-ebe-ya nile guzo, na inye ayi mb͕idi nime Juda na nime Jerusalem.
10 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, àyi gāsi gini mb͕e ihe a gasiri? n'ihi na ayi arapuwo ihe nile I nyere n'iwu,
11 nke I nyere n'iwu site n'aka ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, si, Ala ahu nke unu onwe-unu nābata inweta ya, ala isọ-nsọ ka ọ bu n'isọ-nsọ nke ndi di iche iche nke ala ọzọ, site n'ihe-árú nile ha, nke juputaworo ya site n'otu ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ, n'ọrurú-ha.
12 Ma ub͕u a unu enyela umu-ha ndikom umu-unu ndinyom, unu ekuru-kwa-la umu-ha ndinyom nye umu-unu ndikom, unu achọ-kwa-la udo-ha ma-ọbu ọdi-nma-ha rue mb͕e ebighi-ebi: ka unu we di ike, rie ezi ihe nke ala ahu, me kwa ka umu-unu nweta ya rue mb͕e ebighi-ebi.
13 Ma mb͕e ihe nile a gasiri, nke nābiakwasi ayi n'ihi omume ọjọ nile ayi, na n'ihi ikpe-ọmuma uku ayi, n'ihi na Gi onwe-gi, bú Chineke-ayi, eb͕ochiwo ahuhu-nmehie-ayi, ka ọ ghara idi elu ka ajọ omume-ayi, I we nye ndi-nb͕apu di otú a,
14 àyi gālaghachi kwa mebie ihe nile I nyere n'iwu, we ghọ ọgọ ndi ahu ndi nēme ihe-árú ndia? Ì gaghi-ewesa ayi iwe, rue mb͕e emere ka ayi gwusi, ndi fọduru ma-ọbu ndi-nb͕apu we ghara idi?
15 Jehova, bú Chineke Israel, onye ezi omume ka I bu; n'ihi na ayi fọduru ibu ndi-nb͕apu, dika o si di ta: le, ayi nọ n'iru Gi n'ikpe-ọmuma-ayi; n'ihi na ọ dighi onye iguzo n'iru Gi n'ihi nka.