Ezra

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10


Isi 10

Ma mb͕e Ezra nēkpe ekpere, nēkwuputa kwa ekwuputa, nākwa ákwá nātuda kwa onwe-ya n'ala n'iru ulo Chineke, esiri n'Israel chikọta n'ebe ọ nọ nkpọkọta madu di ọtutu nke-uku, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri: n'ihi na ndi Israel kwara ákwá ri nne.
2 Shekania nwa Jehiel, nke sitere n'umu Ilam, we za, si Ezra, Ayi onwe-ayi emekpuwo emekpu megide Chineke-ayi, luta ndinyom ala ọzọ sitere na ndi di iche iche nke ala nka: ma ub͕u a Israel nwere olile-anya bayere ihe a.
3 Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n'ihe nile nke Chineke-ayi nyere n'iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.
4 Bilie; n'ihi na okwu a diri gi, ayi onwe-ayi nọye-kwa-ra gi: di ike, me kwa ya.
5 Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi.
6 Ezra we si n'iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n'ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n'ihi na o nēru újú n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.
7 Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem;
8 ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n'ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di.
9 Ndikom nile nke Juda na Benjamin we chikọta onwe-ha na Jerusalem n'ubọchi atọ; nke ahu bu ọnwa nke-iteghete, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu: ndi ahu nile we nọdu n'amá ulo Chineke, nāma jijiji n'ihi okwu a, na site n'oké miri-ozuzo nile.
10 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we bilie, si ha, Unu onwe-unu emekpuwo emekpu, luta ndinyom ala ọzọ, itukwasi ihe n'ikpe-ọmuma Israel.
11 Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n'aru ndi di iche iche nke ala nka, na n'aru ndinyom ala ọzọ.
12 Nkpọkọta ahu nile we were oké olu za, si, O ziri ezi, dika okwu-gi nile n'ebe ayi nọ si di, ayi aghaghi ime otú a.
13 Ma ndi Israel di ọtutu, ọ bu kwa mb͕e oké miri-ozuzo, ike adighi kwa ayi iguzo n'èzí, ma ozi a abughi nke otù ubọchi, ọ bughi kwa nke ubọchi abua: n'ihi na ayi ejehiewo ri nne n'okwu a.
14 Biko, ka ndi-isi-ayi guzoro nkpọkọta nka nile, ka ndi nile ndi nọ n'obodo nile ayi bia kwa na mb͕e ezubere, bú ndi lutara ndinyom ala ọzọ, ha na ndi-okenye obodo nile ọ bula, na ndi-ikpe-ya, rue mb͕e iwe ọku nke Chineke-ayi bayere okwu a si n'aru ayi laghachi.
15 Otú ọ di, Jonatan nwa Asahel na Jahzeia nwa Tikva guzoro imegide ihe a: Meshulam na Shabetai, bú onye Livai, yekwara ha aka.
16 Umu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me otú a. Ewe kewapu Ezra, bú onye-nchu-àjà, na ndikom ọzọ, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha nile n'aha-ha kwa; ha we nọdu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-iri ka ha we jua ajuju okwu a.
17 Ha we jubìe ajuju n'okwu ndikom nile ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu.
18 Ewe chọta ufọdu n'etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n'etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia.
19 Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n'ihi ikpe-ọmuma-ha.
20 Na n'etiti umu Imea; Hanani na Zebadaia.
21 Na n'etiti umu Harim; Maaseia, na Elaija, na Shemaia, na Jehiel, na Uzaia.
22 Na n'etiti umu Pashua; Elioenai, na Maaseia, na Ishmael, na Netanel, na Jozabad, na Elasa.
23 Na n'etiti ndi Livai; Jozabad, na Shimai, na Kelaia, (onye ahu bu Kelita), na Petahia, na Juda, na Elieza.
24 Na n'etiti ndi-ọbù-abù; Elaiashib: na n'etiti ndi-ọnu-uzọ-ama; Shalum, na Telem, na Uri.
25 Na n'etiti Israel: n'etiti umu Parosh; Ramia, na Izia, na Malkija, na Mijamin, na Eleeza, na Malkija, na Benaia.
26 Na n'etiti umu Ilam; Matanaia, na Zekaraia, na Jehiel, na Abdi, na Jeremot, na Elaija.
27 Na n'etiti umu Zatu; Elioenai, na Elaiashib, na Matanaia, na Jeremot, na Zabad, na Aziza.
28 Na n'etiti umu Bebai; Jehohanan, na Hananaia, na Zabai, na Atlai.
29 Na n'etiti umu Bani; Meshulam, na Maluk, na Adaia, na Jashub, na Sheal, na Jeremot.
30 Na n'etiti umu Pahat-moab; Adna, na Kelal, na Benaia, na Maaseia, na Matanaia, na Bezalel, na Binui, na Manase.
31 Na n'etiti umu Harim; Elieza, na Ishija, na Malkija, na Shemaia, na Shimeon;
32 Benjamin, na Maluk, na Shemaria;
33 Na n'etiti umu Hashum; Matenai, na Matata, na Zabad, na Elifelet, na Jeremai, na Manase, na Shimai.
34 Na n'etiti umu Bani; Maadai, na Amram, na Uel;
35 na Benaia, na Bedeia, na Keluhi;
36 na Vania, na Meremot, na Elaiashib;
37 na Matanaia, na Matenai, na Jaasu;
38 na Bani, na Binui, na Shimai;
39 na Shelemaia, na Netan, na Adaia;
40 na Maknadebai, na Shashai, na Sharai;
41 na Azarel, na Shelemaia, na Shemaria;
42 na Shalum, na Amaraia, na Josef.
43 N'etiti umu Nebo; Jeiel, na Matitaia, na Zabad, na Zebina, na Ido, na Joel, na Benaia.
44 Ndia nile alutawo ndinyom ala ọzọ na nwunye: ufọdu nime ha nwe-kwa-ra ndinyom ndi ha siri n'aka ha mu umu-ndikom.