Ezra

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10


Isi 8

Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, nka bu kwa akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi nēsom si na Babilon rigo, n'ọbubu-eze Ataksakses, bú eze.
2 Site n'umu Finehas, Giashom: site n'umu Itama, Daniel: site n'umu Devid, Hatush.
3 Site n'umu Shekania; site n'umu Parosh, Zekaraia: ndi soro ya, bú ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu diri ndikom, di ọgu asa na iri.
4 Site n'umu Pahat-moab, Eliehoenai nwa Zerahai; ndi soro ya di ọgu ndikom iri.
5 Site n'umu Shekania, nwa Jahaziel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri-na-ise.
6 Site kwa n'umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri.
7 Site kwa n'umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri.
8 Site kwa n'umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ.
9 Site n'umu Joab, Obadaia nwa Jehiel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri na iri na asatọ.
10 Site kwa n'umu Shelomit, nwa Josifia; ndi soro ya di ọgu ndikom asatọ.
11 Site kwa n'umu Bebai, Zekaraia nwa Bebai; ndi soro ya di orú ndikom na asatọ.
12 Site kwa n'umu Azgad, Johanan nwa Hakatan; ndi soro ya di ọgu ndikom ise na iri.
13 Site kwa n'umu Adonikam, bú ndi-ikpe-azu; ndia bu kwa aha-ha, Elifelet, na Jeuel, na Shemaia; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ.
14 Site kwa n'umu Bigvai, Utai na Zabud; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ na iri.
15 M'we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n'Ahava; ayi we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū n'ebe ahu ubọchi atọ: m'we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m'chọtara n'ebe ahu.
16 M'we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m'kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.
17 M'we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m'we tiye n'ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi.
18 Ha we me ka otù nwoke nke nwere uche biakute ayi, dika ezi aka nke Chineke-ayi si di n'aru ayi, o sitere n'umu Mahli, nwa Livai, nwa Israel; na Sherebia na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-asatọ;
19 na Hashabaia, ya na Jeshaia nke sitere n'umu Merari, na umu-nne-ya na umu-ha ndikom, orú madu;
20 site kwa na Netinim, ndi Devid na ndi-isi nyere ka ha fè òfùfè nke ndi Livai, ọgu Netinim iri-na-otù: ha nile ka akpọrọ n'aha n'aha.
21 M'we kpọsa obubu-ọnu n'ebe ahu, n'akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n'ala n'iru Chineke-ayi ichọta n'aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.
22 N'ihi na emerem ihere iriọ n'aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n'ihi onye-iro nke di n'uzọ: n'ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n'aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya.
23 Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ.
24 M'we kewaputa na ndi-isi nke ndi-nchu-àjà madu iri na abua, bú Sherebia na Hashabaia, ha na madu iri ndi sitere n'umu-nne-ha,
25 m'we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n'ebe ahu, buliri:
26 m'we tùa nye ha n'aka nnù talent ọla-ọcha na ọgu iri-na-abua na iri, na ọgu talent ihe ọla-ọcha ise; na ọgu talent ọla-edo ise;
27 na orú ọkwa ntà ọla-edo, ọtùtù-ha bu nnù daric abua na ọgu iri; na ihe abua nke ezi ọla nācha edo edo, bú ihe anāchọsi ike dika ọla-edo.
28 M'we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.
29 Nechenu ha nche, debe kwa ha, rue mb͕e unu tùru ha n'iru ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, nime Jerusalem, n'ime-ulo nke ulo Jehova.
30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we nara ọtùtù nke ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile, ibūru ha biarue Jerusalem rue ulo Chineke-ayi.
31 Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ.
32 Ayi we biarue Jerusalem, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ.
33 Ma n'ubọchi nke-anọ ka atùru ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile n'ulo Chineke-ayi nye n'aka Meremot, nwa Uraia, bú onye-nchu-àjà; Eleeza nwa Finehas nọye-kwa-ra ya; Jozabad nwa Jeshua na Noadaia nwa Binui, bú ndi Livai, nọye-kwa-ra ha;
34 n'ọnu-ọgugu na n'ọtùtù ka enyere ha ihe ọ bula: ewe de ọtùtù nile n'akwukwọ na mb͕e ahu.
35 Ndi nēsi na ndọta-n'agha bia, bú umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, wetara àjà-nsure-ọku nso Chineke Israel, oke-ehi iri na abua n'ihi Israel nile ọgu ebulu anọ na iri na isi, ọgu umu-aturu atọ na iri na asa, nkpi iri na abua ibu àjà-nmehie: ihe a nile bu àjà-nsure-ọku isurere Jehova.
36 Ha we nye ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala n'ofè osimiri iwu nile nke eze: ha we yere ndi-Ju na ulo Chineke aka.