2 Chronicles

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 35

Josaia we mere Jehova ememe ngabiga nime Jerusalem: ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.
2 O we guzo ndi-nchu-àjà n'ihe-ndebe nile ha, me ka ha di ike ifè òfùfè ulo Jehova.
3 Ọ si ndi Livai, bú ndi nēme Israel nile ka ha ghọta ihe, ndi di nsọ n'ebe Jehova nọ, Tiyenu ib͕e nsọ n'ulo ahu nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel, wuru; ibu agaghi-adiri unu n'ubu: ub͕u a fènu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-Ya, bú Israel, òfùfè.
4 Dozi-kwa-nu onwe-unu dika ulo nna-unu-hà si di n'òkè nile unu, dika odide-akwukwọ Devid, bú eze Israel, si di, na dika odide-akwukwọ Solomon nwa-ya si di.
5 Guzo-kwa-nu n'ebe nsọ dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu-nne-unu si di, bú umu ndi Israel, na òkè ulo nna ndi Livai.
6 B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di.
7 Josaia we bulie nye umu ndi Israel, bú ndi nile ahuru n'ebe ahu, ìgwè ewu na aturu, bú umu-aturu na umu-ewu, ha nile bu iji chu àjà-ngabiga, ọnu-ọgugu-ha ra ka orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù oké-ehi asa na ọgu iri: ndia sitere n'àkù eze.
8 Ndi-isi-ya buli-kwa-ra onyinye-afọ-ofufo nye ndi ahu, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai. Hilkaia na Zekaraia na Jehiel, bú ndi-ndú ulo Chineke, nyere ndi-nchu-àjà nnù ewu na aturu isi na ọgu iri, na ọgu ehi iri-na-isi, iji chu àjà-ngabiga.
9 Konanaia kwa, na Shemaia na Netanel, bú umu-nne-ya, na Hashabaia na Jeiel na Jozabad, bú ndi-isi nke ndi Livai, buliri nye ndi Livai nnù ewu na aturu iri-na-abua na ọgu iri, na nnù ehi na ọgu ise, iji chu àjà-ngabiga.
10 Ewe dozie òfùfè ahu, ndi-nchu-àjà we guzo n'ebe-nguzo-ha, na ndi Livai n'òkè nile ha, dika ihe eze nyere n'iwu si di.
11 Ha we b͕ue anu ngabiga ahu, ndi-nchu-àjà we wusa ọbara nke ha natara n'aka-ha, ndi Livai we nāb͕a akpukpọ-ha.
12 Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n'akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi.
13 Ha we were ọku sie anu ngabiga dika ikpé-ya si di: ma ha siri ihe nsọ ọzọ nile n'ite, na n'ite isi miri, na n'ite-ofé, būru ha b͕akuru umu ndi Israel nile.
14 Emesia ha we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà; n'ihi na ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, nọ n'isure àjà-nsure-ọku na abuba rue abali: ndi Livai we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, bú umu Eron.
15 Ndi-ọbù-abù, bú umu Esaf, nọ kwa n'ebe-nguzo-ha, dika ihe Devid, na Esaf, na Himan, na Jedutun, bú onye-ọhu-uzọ eze, nyere n'iwu si di; ndi-ọnu-uzọ-ama nọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nile ọ bula: ha enweghi ike isi n'òfùfè-ha wezuga onwe-ha, kama umu-nne-ha, bú ndi Livai, doziri ihe nye ha.
16 Ewe dozie òfùfè nile nke Jehova n'ubọchi ahu, ime ememe ngabiga, na isure àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, dika ihe eze, bú Josaia, nyere n'iwu si di.
17 Umu Israel ndi ahuru n'ebe ahu we me ememe ngabiga na mb͕e ahu, na ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa.
18 Emeghi kwa ememe ngabiga dika nka n'Israel site n'ubọchi Samuel, bú onye-amuma; ọ dighi kwa eze Israel ọ bula mere ememe ngabiga dika ememe ngabiga ahu nke Josaia mere, ya na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Juda na Israel nile ahuru n'ebe ahu, na ndi bi na Jerusalem.
19 ọ bu n'arọ nke-iri-na-asatọ nke ọbubu-eze Josaia ka emere ememe ngabiga nka.
20 Mb͕e ihe a nile gasiri, mb͕e Josaia dozisiri ulo Chineke, Neko, bú eze Ijipt, rigoro ibuso Kakemish n'akuku Yufretis agha: Josaia we pua izute ya.
21 O we zigara ya ndi-ozi, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, eze Juda? ọ bughi imegide gi onwe-gi ka m'biaworo ta, kama ijekuru ulo ahu nke m'nēbuso ha agha: ma Chineke siri ka m'me ngwa: gi onwe-gi ra aka-gi n'ebe Chineke nọ, Onye nọyerem, ka Ọ ghara ibibi gi.
22 Ma Josaia esighi n'ebe ọ nọ chigharia iru-ya, kama o nwoghariri onwe-ya ibuso ya agha, ọ geghi kwa nti okwu Neko, bú nke sitere n'ọnu Chineke, o we bia ibu agha nime ndagwurugwu Megido.
23 Ndi-ọb͕a-uta we b͕a eze, bú Josaia; eze we si ndi-orù-ya, Bubiganum; n'ihi na ọria nāriam nke-uku.
24 Ndi-orù-ya we si n'ub͕ọ-ala ahu bubiga ya, me ka ọ nọdu n'ub͕ọ-ala nke-abua nke o nwere, ha we me ka o jerue Jerusalem; o we nwua, elìe ya n'ílì nna-ya-hà. Juda na Jerusalem nile we ruere Josaia újú.
25 Jeremaia we bùara Josaia abù-ákwá: ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom nile we nēkwu okwu bayere Josaia rue ta n'abù-ákwá-ha; ha we tiye ha ibu ukpuru n'ebe Israel nọ: ma, le, edewo ha n'akwukwọ abù-ákwá.
26 Ma ihe nile Josaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, dika ihe edeworo n'iwu Jehova si di,
27 na ihe nile o mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.