2 Chronicles

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 16

N'arọ nke-orú-na-iri-na-isi nke Esa bu eze, Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.
2 Esa we weputa ọla-ọcha na ọla-edo n'àkù ulo Jehova na nke ulo eze, zigara Ben-hedad, bú eze Siria, onye bi na Damaskọs, si,
3 Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom i ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo.
4 Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel; ha we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-maim, na ulo-nchikọbata-ihe nile nke obodo Naftali nile.
5 O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, me ka ozi-ya ahu kwusi.
6 Ma Esa, bú eze, chiri Juda nile; ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; o we were ha wue Geba na Mizpa'
7 Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N'ihi na i dabeworo n'eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n'aka-gi wepuga onwe-ya.
8 Ndi Etiopia na ndi-Lubim, hà abughi usu-ndi-agha n'uba, nēnwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya bara uba nke-uku? ma mb͕e i dabere na Jehova, O nyere ha n'aka-gi.
9 N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.
10 Esa we wesa onye-ọhu-uzọ ahu iwe, tiye ya n'ulo ọtọsi; n'ihi na o nēkosa ya ọnuma n'ihi ihe a. Esa we zọpia ufọdu nime ndi-ya na mb͕e ahu.
11 Ma, le, ihe nile Esa mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.
12 Esa we ria ọria n'ukwu-ya abua n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n'ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n'etiti ndi-dibia.
13 Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ọ nwua n'arọ nke-ọgu-abua-na-otú ọ bu eze.
14 Ha we lìe ya n'ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n'obodo Devid, ha we me ka o dina n'ihe-ndina nke emejuru n'uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n'ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.