2 Chronicles

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36


Isi 32

Mb͕e ihe ndia na ezi-okwu a gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, biara, ba nime Juda, we ma ulo-ikwū-ya imegide obodo nile ewusiri ike, si na o gētipú ha nye onwe-ya.
2 Hezekaia we hu na Senakerib abiawo, che iru ibuso Jerusalem agha,
3 o we me ndi-isi-ya na ndi-dike-ya ka ha dua ya ọdu, ib͕ochi miri nke isi-iyi nile nke di n'azu obodo; ha we yere ya aka.
4 Ewe chikọta ndi di ọtutu, ha we b͕ochie isi-iyi nile, na miri-iyi ahu nke nērùsi ike n'etiti ala-ha, si, N'ìhi gini ka ndi-eze Asiria gābia, hu ọtutu miri?
5 O we me onwe-ya ka ọ di ike, we wuzie mb͕idi nile nke etipúru etipú, o we wulie ya rue ulo-elu-ya nile, wu kwa mb͕idi ọzọ n'azu, me ka Milo, nke di n'obodo Devid, di ike, o me-kwa-ra ihe-agha na ọta n'uba.
6 O we do ndi-ọchi-agha ka ha buru ndi-isi ndi-ya, o we chikọta ha n'ebe ọ nọ n'amá nke ọnu-uzọ-ama obodo, gwa ha okwu nābà n'obi-ha, si,
7 Dinu ike nwe kwa ume, unu atula egwu atu-kwa-la ujọ n'ihi eze Asiria, ma-ọbu n'ihi ìgwè ahu nile nke nọyere ya: n'ihi na nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya:
8 nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.
9 Mb͕e nka gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, zigara ndi-orù-ya na Jerusalem, (ma ya onwe-ya nānọchigide Lekish n'agha, ya na ndi nile ọ nāchi,) jekuru Hezekaia, bú eze Juda, jekuru kwa Juda nile ndi nọ na Jerusalem, si,
10 Otú a ka Senakerib, bú eze Asiria, siri, N'ìhe gini ka unu onwe-unu nātukwasi obi, unu we nānọdu n'ebe ewusiri ike, bú nime Jerusalem?
11 Hezekaia, ọ̀ dighi-akpali unu, ira unu nye ka unu nwua site n'oké unwu, site kwa n'akpiri-ikpọ-nku, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gānaputa ayi n'ọbu-aka eze Asiria?
12 Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n'iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n'elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ?
13 Ùnu amaghi ihe m'mere ndi nile nke ala ọzọ nile, mu onwem na nnam-hà? chi mba nile nke ala ọzọ nile, hà puru inaputa ala-ha n'akam ma-ọli?
14 Ọ̀ bu onye n'etiti chi nile nke mba ndia, bú ndi nnam-hà wezugara ka ebibie ha, nke puru inaputa ndi-ya n'akam, na Chineke-unu puru inaputa unu n'akam?
15 Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam.
16 Ndi-orù-ya kwu-kwa-ra okwu ọzọ imegide Jehova, bú Chineke, na imegide orù-Ya, bú Hezekaia.
17 Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n'akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n'akam.
18 Ha we were oké olu kpọ ndi Jerusalem ndi nọ n'elu mb͕idi òkù n'asusu ndi-Ju, ime ka ha tua egwu, na ime ka ha ma jijiji; ka ha we were obodo-ha.
19 Ha we kwue okwu bayere Chineke Jerusalem, dika ha si ekwu okwu bayere chi nile nke ndi uwa, bú ọlu aka madu.
20 Hezekaia, bú eze, na Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, we kpe ekpere bayere ihe a, we tikue elu-igwe.
21 Jehova we ziga mọ-ozi, o we kpochapu ndi-dike nile bu dìnkpà, na ndi-ndú na ndi-isi, n'ọmuma-ulo-ikwū nke eze Asiria. O we were ihere iru laghachi n'ala-ya. O we ba n'ulo chi-ya, ndi siri na ngiri-afọ-ya we were mma-agha me ka ọ da nwua n'ebe ahu.
22 Jehova we zọputa Hezekaia na ndi bi na Jerusalem n'aka Senakerib, bú eze Asiria, na n'aka madu nile, we nēdu ha buruburu.
23 Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n'anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri.
24 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube.
25 Ma ọ bughi dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n'ihi na obi-ya di elu: iwe we dikwasi ya, dikwasi kwa Juda na Jerusalem.
26 Hezekaia we ruru ala n'ihi idi-elu nke obi-ya, ya onwe-ya na ndi bi na Jerusalem, iwe Jehova abiakwasighi kwa ha n'ubọchi Hezekaia.
27 Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike;
28 o me-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe idebe omume ọka na manya-vine ọhu na manu; na ulo anu nile ọ bula di iche iche, na ìgwè aturu n'ulo-anu.
29 O we mere onwe-ya obodo di iche iche, na ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'uba: n'ihi na Chineke nyere ya àkù bara uba nke-uku.
30 Hezekaia nka b͕ochi-kwa-ra isi-iyi miri Gaihon di n'elu, we me ka miri ahu rùdazie n'akuku Ọdida-anyanwu obodo Devid. Ihe nāga-kwa-ra Hezekaia nke-ọma n'ọlu-ya nile.
31 Otú ọ di, n'okwu ndi-ukọ nke ndi-isi Babilon, ndi zitere ya ozi iju ajuju bayere ihe-ebude nke mere n'ala, Chineke rapuru ya inwa ya, ka O we mara ihe nile di n'obi-ya.
32 Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, le, edewo ha n'ọhù Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.
33 Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'ebe-nrigo nke ílì umu Devid. Juda nile na ndi bi na Jerusalem we mere ya ihe-nsọpuru n'ọnwu-ya. Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.