Ndi-Ikpe
Isi 5
Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si,
2 N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel,
N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha,
Gọzienu Jehova.
3 Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi;
Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem;
M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.
4 Jehova, mb͕e I siri na Sia puta,
Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije,
Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri,
Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri.
5 Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova,
Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel.
6 N'ubọchi Shamga nwa Anat,
N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi,
Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ.
7 Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi,
Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri,
Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.
8 Ha rọputara chi ọhu di iche iche;
Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile:
Àhuru ọta ma-ọbu ube
N'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel?
9 Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ,
Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel:
Gọzienu Jehova.
10 Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu,
Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda,
Unu na ndi nēje ije n'uzọ,
Tugharinu uche.
11 N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri,
N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova,
Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel.
Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.
12 Teta, teta, Debora;
Teta, teta, kwue okwu abù:
Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam.
13 Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara;
Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike.
14 Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida;
Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi.
Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida,
Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.
15 Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora;
Dika Isaka si di, otú a ka Berak di;
Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua.
Na miri-iyi nile nke Reuben
Ka oké nzube obi di.
16 N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi,
Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu?
Na miri-iyi nile nke Reuben
Ka oké nnyocha obi di.
17 Gilead biri n'ofè Jọdan:
Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o?
Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri,
Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.
18 Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu,
Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia.
19 Ndi-eze biara, bū agha;
Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha,
Nime Teanak n'akuku miri Megido:
Ọ dighi urù ego ha nara.
20 N'elu-igwe ka ha si bū agha,
Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.
21 Miri-iyi Kaishon bupuru ha,
Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon.
Nkpuru-obim, i nāzọda ike.
22 Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ike
Site n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike.
23 Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri,
Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku;
N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka,
Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.
24 Agāgọzi Jael kari ndinyom,
Bú nwunye Heba onye-Kenait,
Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya.
25 Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya;
O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.
26 Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú,
Aka-nri-ya n'otùtù ndi nālu ọlu ike;
O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n'isi,
O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n'akuku egedege-iru-ya.
27 N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ:
N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da:
Ebe o ruru ala, n'ebe ahu ka ọ dara, la n'iyì.
28 Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu,
Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe,
Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia?
Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?
29 Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya,
E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile,
30 Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata?
Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi;
Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera,
Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma,
Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?
31 Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova:
Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya.
Ala we di jū ọgu arọ abua.