Ndi-Ikpe

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21


Isi 21

Ma ndikom Israel ṅuru iyi na Mizpa, si, Ọ dighi nwoke ọ bula nime ayi gēnye Benjamin nwa-ya nwayi na nwunye.
2 Ndi Israel we biarue Bet-el, nọdu n'ebe ahu rue anyasi n'iru Chineke, welie olu-ha, kwa ákwá nke-uku.
3 Ha we si, Jehova, bú Chineke nke Israel, n'ìhi gini ka nka di n'Israel, na agāgupu otù ebo n'Israel ta?
4 O rue, n'echi-ya, na ndi Israel biliri n'isi-ututu, wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo.
5 Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua.
6 Umu Israel we cheghari uche bayere Benjamin, bú nwa-nne-ha, si, Ebipuru otù ebo n'Israel ta.
7 Gini ka ayi gēmere ha, bú ndi fọduru, inye ha nwunye, ebe ayi onwe-ayi were Jehova ṅua iyi na ayi agaghi-enye ha nime umu-ayi ndinyom na nwunye?
8 Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.
9 Ndi Israel we gukọta onwe-ha, ma, le, ọ dighi nwoke sitere na ndi bi na Jebesh-gilead nọ n'ebe ahu.
10 Nzukọ Israel we ziga n'ebe ahu orú nnù ndikom na nnù iri sitere na ndi bu dìnkpà, ha we nye ha iwu, si, Jenu, were ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi na Jebesh-gillead, ha na ndinyom na umu-ntakiri.
11 Nka bu kwa ihe unu gēme; unu gēwezuga nwoke ọ bula na nwayi ọ bula nke mara ndina nwoke, ka ebibie ya.
12 Ha we chọta n'etiti ndi bi na Jebesh-gilead nnù umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke site na ndina nwoke: ha we me ka ha biarue ọmuma-ulo-ikwū rue Shailo nke di n'ala Kenean.
13 Nzukọ Israel nile we ziga, gwa umu Benjamin okwu, bú ndi nọ na nkume di elu, bú Rimon, we kpọ ha òkù udo.
14 Benjamin we lata na mb͕e ahu; ha we nye ha ndinyom ahu ndi ha mere ka ha di ndu site na ndinyom Jebesh-gilead: ma ha achọtaghi nwunye gēzuru ha nile otú a.
15 Ndi Israel we cheghari uche bayere Benjamin, n'ihi na Jehova emewo ntiwa n'ebo Israel nile.
16 Ndi-okenye nzukọ Israel we si, Gini ka ayi gēmere ndi fọduru inye ha nwunye, n'ihi na ekpochapuwo ndinyom nime Benjamin?
17 Ha we si, Ihe-nnweta nke ndi b͕apuru ab͕apu ka ala nke Benjamin bu, ka aghara ihichapu ebo n'Israel.
18 Ma ayi onwe-ayi apughi inye ha nwunye sitere n'umu-ayi ndinyom: n'ihi na umu Israel ṅuru iyi, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēnye Benjamin nwunye.
19 Ha we si, Le, ememe Jehova di na Shailo kwa-arọ, nke di n'akuku Ugwu Bet-el, n'akuku ọwuwa-anyanwu nke uzọ atuliri atuli nke nārigo site na Bet-el rue Shekem, na n'akuku Ndida nke Lebona.
20 Ha we nye umu Benjamin iwu, si, Jenu, che anwu n'ubi-vine;
21 hu-kwa-nu, ma, le, ọ buru na umu-ndinyom Shailo aputa ite egwú nime otiti-egwú-ha, unu gēsi kwa n'ubi-vine puta, nwudere onwe-unu, nwoke ọ bula nwunye-ya, site n'umu-ndinyom Shailo, la n'ala Benjamin.
22 O gēru kwa, mb͕e ndi bu nna-ha ma-ọbu umu-nne-ha biara ichọ ayi okwu, na ayi gāsi ha, Nyenu ayi ha n'amara: n'ihi na ayi anwudeghi nye nwoke ọ bula nwùnye-ya n'agha: ma unu onwe-unu eweghi ha nye ha; ma ọ bughi otú a, ikpe gāma unu ub͕u a.
23 Umu Benjamin we me otú a, kuru nwunye, dika ọnu-ọgugu-ha si di, site na ndinyom nēte egwū, ndi ha nāpunara ndi Shailo: ha we je lata n'ihe-nketa-ha, wue obodo-ha, biri nime ha.
24 Umu Israel we si n'ebe ahu la na mb͕e ahu, nwoke ọ bula ọ lakuru ebo-ya, lakuru ab͕uru-ya, ha we si n'ebe ahu pua, nwoke ọ bula rue ihe-nketa-ya.
25 Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel, onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n'anya-ya.