Ndi-Ikpe

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21


Isi 10

Mb͕e Abimelek nwusiri, Tola nwa Pua, nwa Dodo, bú onye Isaka, we bilie izọputa Israel; ya onwe-ya bi kwa na Shamia n'ugwu Efraim.
2 Ọ we kpe Israel ikpe orú arọ na atọ, we nwua, elìe ya na Shamia.
3 Mb͕e ọ nwusiri, Jaia, bú onye Gilead, we bilie; ọ kpe Israel ikpe orú arọ na abua.
4 Ọ nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ndi orú umu-inyinya-ibu na iri nēbu, ha nwe-kwa-ra orú obodo na iri, nke anākpọ Havot-jaia rue ta, nke di n'ala Gilead.
5 Jaia we nwua, elìe ya na Kamon.
6 Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim, na Ashtarot, na chi nile nke Siria, na chi nile nke Zaidon, na chi nile nke Moab, na chi nile nke umu Amon, na chi nile nke ndi Filistia, òfùfè; ha we rapu Jehova, ha efèghi kwa Ya òfùfè.
7 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka ndi Filistia, na n'aka umu Amon.
8 Ha we tipia, kpab͕u kwa umu Israel arọ ahu: arọ iri na asatọ ka ha kpab͕uru umu Israel nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ala ndi-Amorait, nke di na Gilead.
9 Umu Amon we gabiga Jọdan ibuso kwa Juda, na ibuso Benjamin, na ibuso ulo Efraim, agha; ewe kpab͕ue Israel nke-uku.
10 Umu Israel we tikue Jehova, si, Ayi emehiewo megide Gi, ọbuná n'ihi na ayi arapuwo Chineke-ayi, we fè Bealim òfùfè.
11 Jehova we si umu Israel, Àzọputaghm unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi-Amorait, na n'aka umu Amon, na n'aka ndi Filistia?
12 Ndi Zaidon kwa, na Amalek, na Maon, meb͕uru unu; unu we tikuem, M'we zọputa unu n'aka-ha.
13 Ma unu onwe-unu arapuwom, we fè chi ọzọ di iche iche òfùfè: n'ihi ya M'gaghi-azọputa kwa unu ọzọ.
14 Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu.
15 Umu Israel we si Jehova, Ayi emehiewo: Gi onwe-gi me ayi dika ihe nile si di nke di nma n'anya-Gi; biko, nání naputa ayi ta.
16 Ha we si n'etiti ha wezuga chi ala ọzọ nile, fè Jehova òfùfè: nkpuru-obi-Ya enweghi kwa ntachi-obi n'ihi ọnọdu ọjọ nke Israel.
17 Umu Amon we kpọkọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Gilead. Umu Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Mizpa.
18 Ndi ahu, bú ndi-isi Gilead, we sirita onwe-ha, Ònye bu nwoke ahu nke gāmalite ibuso umu Amon agha? ọ gāghọrọ ndi nile bi na Gilead isi.