Levitikọs

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27


Isi 6

Jehova we gwa Moses okwu, si,
2 Mb͕e madu gēmehie, mekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ghọb͕u madu-ibe-ya n'ihe-ndebe, ma-ọbu n'ihe etiyere n'aka-ya, ma-ọbu n'ihe anapuru madu n'ike, ma-ọbu mb͕e ọ meb͕uworo madu-ibe-ya;
3 ma-ọbu mb͕e ọ hutaworo ihe furu efu, o we ghọ aghughọ nime ya, ṅu iyi n'ugha; n'otù nime ihe ndia nile nke madu nēme, nēmehie nime ha:
4 o gēru kwa, mb͕e ọ gēmehie, mb͕e ikpe mara ya, na ọ gēnyeghachi ihe ọ napuru madu n'ike, ma-ọbu ihe ọ nwetara na nmeb͕u, ma-ọbu ihe-ndebe enyere ya idebe, ma-ọbu ihe furu efu nke ọ huta-woro,
5 ma-ọbu ihe ọ bula nke ọ ṅuru iyi bayere ya n'ugha; o gākwughachi kwa ya na nkwuzu-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya: ọ bu onye nwe ihe ahu ka ọ gēnye ya, n'ubọchi àjà-ikpe-ọmuma-ya.
6 Ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè sitere n'ìgwè ewu na aturu, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ọ gēwetara onye-nchu-àjà:
7 onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova, agāb͕aghara kwa ya ya; bayere ihe ọ bula nime ihe nile nke ọ nēme, nke ikpe mara ya nime ya.
8 Jehova we gwa Moses okwu, si,
9 Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n'elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya.
10 Onye-nchu-àjà gēyiri kwa uwe-nwuda ákwà ọcha ya, uwe-ukwu ákwà ọcha ya ka o gēyikwasi kwa n'anu-aru-ya; ọ gāchili kwa ntu ahu nke ọku gērechaputa n'àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà, dọba ha na nso ebe-ichu-àjà.
11 O gēyipu uwe-ya, yiri uwe ọzọ, bupu ntu ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, rue ebe di ọcha.
12 Agēme kwa ka ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya, ọ gaghi-anyu anyu; onye-nchu-àjà gēsure nkú ọku n'elu ya kwa-ututu: o gēdo kwa àjà-nsure-ọku n'usoro n'elu ya, sure kwa abuba nke àjà-udo nile ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya.
13 Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.
14 Nka bu kwa iwu onyinye-inata-iru-ọma: umu-ndikom Eron gēweta ya nso n'iru Jehova, n'iru ebe-ichu-àjà.
15 O gēsite nime ya weju nweju-aka-ya weli, bú site n'utu ọka flour nke onyinye-inata-iru-ọma, site kwa na manu-ya, weli kwa frankincense nile nke di n'elu onyinye-inata-iru-ọma ahu, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà ka ọ buru ihe ísì utọ, dika ihe-ncheta-ya, anēsurere Jehova.
16 Ma ihe fọduru nime ya, Eron na umu-ya ndikom gēri ya: nēkoghi eko ka agēri ya n'ebe di nsọ; n'ogige ulo-ikwū nzute ka ha gēri ya.
17 Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n'àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma.
18 Nwoke ọ bula n'etiti umu Eron gēri ya, dika ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile, site n'àjà-ọku nke Jehova: onye ọ bula nke nēmetu ha aru gādi nsọ.
19 Jehova we gwa Moses okwu, si,
20 Nka bu onyinye iji biaru nso nke Eron na umu-ya ndikom, nke ha gēwetara Jehova nso n'ubọchi etere ya manu; otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-ọma mb͕e dum, nkera-ya n'ututu, nkera-ya kwa n'anyasi.
21 N'ite isi ihe ka agēwere manu me ya; mb͕e ọ deworo edè i gēwebata ya: iberibe achicha esiri esi nke onyinye-inata-iru-ọma ka i gēweta nso ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova.
22 Onye-nchu-aja etere manu nke gānọchi ya site n'umu-ya ndikom gēme ya: ọ bu ukpuru ebighi-ebi Jehova nwere; agēsuresi ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
23 Onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke onye-nchu-àjà ka agēsuresi kwa oku: agaghi-eri ya.
24 Jehova we gwa Moses okwu, si,
25 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si, Nka bu iwu àjà-nmehie: n'ebe anēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka agēb͕u ihe àjà-nmehie n'iru Jehova: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
26 Onye-nchu-àjà nke nāchu ya bayere nmehie gēri ya; n'ebe di nsọ ka agēri ya, n'ogige ulo ikwū nzute.
27 Ihe ọ bula nke nēmetu anu-ya aru gādi nsọ: mb͕e efesara ufọdu nime ọbara-ya n'uwe ọ bula, i gāsu kwa ihe ahu efesara ya n'elu ya n'ebe di nsọ.
28 Ma agētiwa ihe ájá nke esiri ya nime ya: ma ọ buru na n'ihe ọla ka esiri ya, agēchicha ya, ṅacha ya na miri.
29 Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
30 Ọ dighi kwa àjà-nmehie ọ bula agēri, bú nke anēwebata ufọdu nime ọbara-ya n'ulo-ikwū nzute ikpuchi nmehie n'ebe nsọ ahu: agēwere ọku sure ya.