Levitikọs

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27


Isi 24

Jehova we gwa Moses okwu, si,
2 Nye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum.
3 N'èzí ákwà-nb͕ochi nke ihe-àmà, n'ulo-ikwū nzute, ka Eron gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova mb͕e dum: ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile.
4 N'elu ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka ọ gēdo oriọna nile n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum.
5 Ọzọ, i gēwere utu ọka flour, sie ya ka ọ buru ob͕e achicha iri na abua: uzọ abua n'uzọ iri nke ephah gādiri otù ob͕e achicha.
6 I gēdo kwa ha n'usoro abua, isi n'otù usoro, n'elu table nke ọla-edo anāgwaghi agwa n'iru Jehova.
7 I gētiye kwa frankincense anāgwaghi agwa n'elu usoro ọ bula, ka ọ we ghọrọ achicha ahu ihe-ncheta, bú àjà-ọku anāchuru Jehova.
8 Kwa-ubọchi-izu-ike o gēdo ya n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum; o sitere n'umu Israel, ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ bu.
9 Ọ gādiri Eron na umu-ya ndikom; ha gēri ya n'ebe di nsọ n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru ya sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova, ọ bu ukpuru ebighi-ebi.
10 Nwa-nwoke nke nwayi Israel, nwoke ahu bu kwa nwa nke nwoke Ijipt, we pua je n'etiti umu Israel: nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu na otù onye Israel we lua ọ̀gù n'ọmuma-ulo-ikwū;
11 nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu we kpọlu Aha ahu, kọcha kwa: ha we me ka ọ biakute Moses. Aha nne-ya bu Shelomit, nwa-nwayi Dibri, nke ebo Dan.
12 Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, ka ewe kọrọ ha ala okwu ahu n'ọnu Jehova.
13 Jehova we gwa Moses, okwu, si,
14 Me onye ahu nākọcha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ndi nile nke nuru olu-ya gēbikwasi aka-ha n'isi-ya, nzukọ nile gātub͕u ya na nkume.
15 I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Onye ọ bula, mb͕e ọ nākọcha Chineke-ya, o gēbu nmehie-ya.
16 Onye nākpọlu kwa aha Jehova, aghaghi ime ka ọ nwua; nzukọ Israel nile aghaghi itub͕u ya na nkume: dika anēme ọbìa, otú a ka agēme onye amuru n'ala, mb͕e ọ nākpọlu aha Jehova agēme ka ọ nwua.
17 Onye ọ bula mb͕e ọ gētipu ndu madu, aghaghi ime ka ọ nwua;
18 Onye nētipu kwa ndu anu-ulo gākwughachi ya: ndu lara ndu.
19 Ọzọ, onye ọ bula, mb͕e ọ gēme ka ọlu di n'aru madu-ibe-ya; dika ọ meworo, otú a ka agēme ya;
20 nkpaji lara nkpaji, anya lara anya, ezé lara ezé: dika o meworo ka ọlu di n'aru madu, otú a ka agēme ka ọlu di n'aru ya.
21 Onye nētib͕u anu-ulo gākwughachi ya: ma onye nētib͕u madu, agēme ka ọ nwua.
22 Otù ikpé diri unu, dika anēkpe ọbìa, otú a ka agēkpe onye amuru n'ala: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
23 Moses we gwa umu Israel okwu, ha we me onye ahu nākocha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we tub͕ue ya na nkume. Umu Israel we me dika Jehova nyere Moses iwu.