Levitikọs

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27


Isi 10

Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya, we weta nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n'iwu.
2 Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova.
3 Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.
4 Moses we kpọ Mishael na Elzafan, bú umu-ndikom Uziel nwa-nne nna Eron, si ha, Biaruenu nso, si n'iru ebe nsọ a bupu umu-nne-unu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
5 Ha we biaru nso, buru ha n'uwe-ime-ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Moses kwuru.
6 Moses we si Eron, ọ si kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom, Unu akọpula agiri-isi-unu, unu adọwa-kwa-la uwe-unu; ka unu we ghara inwu, ka Ọ we ghara kwa iwe iwe megide nzukọ Israel nile: ma ka umu-nne-unu, bu ulo nile nke Israel, kwara nsure-ọku ahu nke Jehova sureworo akwá.
7 Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua, ka unu we ghara inwu: n'ihi na manu otite-manu nke Jehova dikwasi unu. Ha we me dika okwu Moses si di.
8 Jehova we gwa Eron okwu, si,
9 Aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n'ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu; ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile:
10 ka unu we kpa kwa ókè n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, na n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha;
11 ka unu we zí kwa umu Israel ukpuru nile nke Jehova gwaworo ha site n'aka Moses.
12 Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
13 Unu gēri kwa ya n'ebe di nsọ, n'ihi na òkè-gi, na òkè umu-gi ndikom, ka ọ bu, sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu.
14 Okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka unu gēri kwa n'ebe di ọcha; gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom tiyere gi: n'ihi na dika òkè-gi na òkè umu-gi ndikom ka enyeworo ha site n'ihe àjà nile nke àjà-udo nile nke umu Israel.
15 Utaku-ukwu nke àjà-nbuli na okpukpu-obi nke àjà-ofufé ka ha gēweta n'elu àjà-ọku nile nke abuba nile, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa nke gí, na nke umu-gi ndikom tiyere gi, dika òkè-unu ebighi-ebi; dika Jehova nyere iwu.
16 Moses we chọsie nkpi nke àjà-nmehie ike, ma, le, esurewo ya ọku: ọ we iwe n'aru Eleeza na n'aru Itama, bú umu-ndikom Eron fọduru, si,
17 Gini mere unu erighi àjà-nmehie n'ebe nke ebe nsọ ahu? n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, ọ bu kwa ya ka O nyeworo unu ibupu ajọ omume nke nzukọ Israel, ikpuchiri ha nmechie-ha n'iru Jehova.
18 Le, ebubataghi ọbara-ya n'ebe nsọ a nime: unu aghaghi iri ya n'ebe nsọ a, dika m'nyere iwu.
19 Eron we gwa Moses okwu, si, Le, ta ka ha wetaworo àjà-nmehie-ha na àjà-nsure-ọku-ha nso n'iru Jehova; ihe dika ihe ndia we dakwasim: asi kwa na eririm àjà-nmehie ahu ta, ọ̀ gādi nma n'anya Jehova?
20 Mb͕e Moses nuru ya, ọ we di nma n'anya-ya.