Ọpupu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40


Isi 7

Jehova we si Moses, Le, emewom i ka i ghọrọ Fero chi: Eron, bú nwa-nne-gi, gābu kwa onye-amuma-gi.
2 Gi onwe-gi gēkwu ihe nile nke M'nēnye gi n'iwu: Eron nwa-nne-gi gāgwa kwa Fero okwu, ka ọ we zipu umu Israel n'ala-ya.
3 Ma Mu onwem gēme ka obi Fero sie ike, M'gēme kwa ka ihe-iriba-amam na ihe-ebubem di ọtutu n'ala Ijipt.
4 Ma Fero agaghi-ege unu nti, M'gētiye kwa akam n'aru ndi Ijipt, were kwa ikpé uku di iche iche me ka usu nile nke ndi-agha nkem, bú ndim umu Israel, si n'ala Ijipt puta.
5 Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēseti akam n'aru ndi Ijipt, me ka umu Israel si n'etiti ha puta.
6 Moses na Eron we me ya; dika Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere.
7 Moses b͕ara ọgu arọ anọ, Eron b͕a-kwa-ra ọgu arọ anọ na atọ, mb͕e ha gwara Fero okwu.
8 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
9 Mb͕e Fero gāgwa unu okwu, si, Merenu onwe-unu ihe-ebube: i gāsi kwa Eron, Were nkpa-n'aka-gi, tuda ya n'iru Fero, ka ọ ghọ ogologo anu.
10 Moses na Eron we bakuru Fero, me otú a, dika Jehova nyere ha iwu: Eron we tuda nkpa-n'aka-ya n'iru Fero, na n'iru ndi-orù-ya, ọ we ghọ ogologo anu.
11 Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a.
12 Ha we tuda, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya, ha we ghọ ogologo anu: ma nkpa-n'aka Eron lodara nkpa-n'aka-ha.
13 Obi Fero we di ike, Ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.
14 Jehova we si Moses, Obi Fero di arọ́, ọ nāju izipu ndim.
15 Jekuru Fero n'ututu; le, ọ nāpu ije miri; i gēguzo onwe-gi n'usọ osimiri Nail izute ya; nkpa-n'aka ahu kwa nke b͕anwere ghọ agwọ, i gēwere ya n'aka-gi.
16 I gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, O zìwom biakute gi, si, Zipu ndim, ka ha we fèm n'ọzara: ma, le, i nughi rue ub͕u a.
17 Otú a ka Jehova siri, Nime nka ka i gāmara na Mu onwem bu Jehova: le, mu onwem gaje iwere nkpa-n'aka nke di n'akam tikwasi miri nke di n'osimiri Nail, ọ gāb͕anwe ghọ ọbara.
18 Azù nke di n'osimiri Nail gānwu, osimiri Nail gēsì kwa ísì; ndi Ijipt gāsọ iṅu miri si n'osimiri Nail puta oyi.
19 Jehova we si Moses, Si Eron, Were nkpa-n'aka-gi setipu aka-gi n'elu miri nile nke Ijipt, n'elu osimiri nile ha, na n'elu osimiri Nail nile ha, na n'elu ọdọ-miri nile ha, na n'elu ebe-nchikọta-miri-ha nile, ka ha we ghọ ọbara; ọbara gādi kwa n'ala Ijipt nile, ma n'ihe nke osisi ma n'ihe nke nkume.
20 Moses na Eron we me otú a, dika Jehova nyere iwu; ọ we welie nkpa-n'aka ahu tie miri nke di n'osimiri Nail, n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya; miri nile nke di n'osimiri Nail we b͕anwe ghọ ọbara.
21 Azù nke di n'osimiri Nail we nwua; osimiri Nail nēsì kwa ísì, ndi Ijipt apughi kwa iṅu miri si n'osimiri Nail puta; ọbara ahu we di n'ala Ijipt nile.
22 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.
23 Fero we chigharia, ba n'ulo-ya, ma o tiyeghi obi-ya ọbuná na nka.
24 Ndi Ijipt nile we gwue olùlù buruburu osimiri Nail inwe miri-ọṅuṅu; n'ihi na ha apughi iṅu miri osimiri Nail.
25 Ubọchi asa we zue, ka Jehova tisiri osimiri Nail ihe.