Ọpupu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40


Isi 4

Moses we za, si, Ma, le, ha agaghi-ekwem, ha agaghi-ege kwa nti n'olum: n'ihi na ha gāsi, Jehova emeghi ka i hu Ya anya.
2 Jehova we si ya, Gini bu ihe ahu di n'aka-gi? Ọ si, Nkpa-n'aka.
3 Ọ si, Tuda ya n'ala. Ọ we tuda ya n'ala, o we ghọ agwọ; Moses we b͕apu n'iru ya.
4 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi, jide ya n'ọdùdù: (ọ we setipu aka-ya, jide ya, ọ we ghọ nkpa-n'aka-ya:)
5 ka ha we kwe na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, emewo gi ka i hu Ya.
6 Jehova si-kwa-ra ya ọzọ, Biko, tiye aka-gi n'obi-gi. Ọ we tiye aka-ya n'obi-ya: ọ we weputa ya, ma, le, aka-ya bu ekpenta, dika aku mmiri igwe.
7 Ọ we si, Tiyeghachi aka-gi n'obi-gi. (Ọ we tiyeghachi aka-ya n'obi-ya; ọ we weputa ya n'obi-ya, ma, le, ọ we dighachi ka anu-aru-ya.)
8 O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi gi, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'ọlụ ihe-iriba-ama mbu, na ha gēkwe ọlụ ihe-iriba-ama nke ikpe-azu.
9 O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi kwa ihe-iriba-ama abua ndia, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'olu-gi, na i gēwere ufọdu nime miri nke osimiri Nail, wusi ya n'ala-akọrọ: miri ahu nke i nēweputa n'osimiri Nail gāghọ kwa ọbara, ọ gāghọ ọbara n'ala-akọrọ.
10 Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m'bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n'ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m'bu.
11 Jehova we si ya, Ònye tiyeworo ọnu madu nwere? ma-ọbu ònye nēme madu ka ọ buru onye-ob͕i, ma-ọbu onye nti chiri, ma-ọbu onye nāhu uzọ, ma-ọbu onye-ìsì? Ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova?
12 Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu.
13 Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n'aka onye I gēziga.
14 Iwe Jehova we di ọku n'aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n'obi-ya.
15 I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme.
16 Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke.
17 Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.
18 Moses we je, laghachikuru Jetro, bú nna nwunye-ya, si ya, Biko, ka m'je, laghachikuru umu-nnem ndi nọ n'Ijipt, hu ma ha nọ ndu ub͕u a. Jetro we si Moses, Je n'udo.
19 Jehova we si Moses nime Midian, Je, laghachi n'Ijipt: n'ihi na ndikom ahu nile ndi nāchọ ndu-gi anwuruwo.
20 Moses we chiri nwunye-ya na umu-ya ndikom, me ka inyinya-ibu buru ha, ọ we laghachi n'ala Ijipt: Moses we were nkpa-n'aka Chineke n'aka-ya.
21 Jehova we si Moses, Mb͕e i je ilaghachi n'Ijipt, le anya ka i me n'iru Fero ihe-ebube nile nke M'tiyere n'aka-gi: ma Mu onwem gēme ka obi-ya di ike, ọ gaghi-ezipu kwa ndim.
22 I gāsi kwa Fero, Otú a ka Jehova siri, Nwam, bú ọkparam, ka Israel bu:
23 M'we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi.
24 O rue, n'uzọ n'ebe inọ ọnọdu-abali, na Jehova zutere ya, chọ ime ka ọ nwua.
25 Zipora we were ọ́mú, bipu api nwa-ya, me ka ọ metu ukwu abua nke di-ya; Zipora we si, N'ezie di nke ọbara ka i bu n'ebe m'nọ.
26 Ọ we rapu ya ndu. Mb͕e ahu Zipora siri, Di nke ọbara ka i bu, bayere obibì-úgwù.
27 Jehova we si Eron, Jerue ọzara izute Moses. Ọ we je, zute ya n'ugwu Chineke, sutu ya ọnú.
28 Moses we gosi Eron okwu nile nke Jehova, bú nke O zitere ya ka o kwue, na ihe-iriba-ama nile Ọ nyere ya iwu ka ọ me.
29 Moses na Eron we je chikọta ndi-okenye nile nke umu Israel:
30 Eron we kwue okwu nile nke Jehova gwara Moses, ọ me kwa ihe-iriba-ama nile n'anya ndi Israel.
31 Ndi ahu we kwere: mb͕e ha nuru na Jehova letarari umu Israel, na Ọ hu-kwa-rari nweda-n'ala nke ha, ha rube isi kpọ isi ala.