Ọpupu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40


Isi 15

Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si, Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku: Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.
2 Ikem na abù ọmam ka Ja bu, Ọ we ghọrọm nzọputa: Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu; Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu.
3 Jehova bu onye-agha: Jehova bu aha-Ya.
4 Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n'oké osimiri: Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n'Oké Osimiri Uhie.
5 Ob͕u-miri nēkpuchi ha: Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume.
6 Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike, Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.
7 N'idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi: I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka.
8 Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo, Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo; Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri.
9 Onye-iro siri, M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara: Nkpuru-obim gējuputa na ha, M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.
10 I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha: Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.
11 Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova? Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ? Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.
12 I setiri aka-nri-Gi, Ala elo ha.
13 N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo: N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.
14 Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji: Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.
15 Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri: Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha: Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.
16 Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha; N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume; Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova, Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.
17 I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi, Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova, Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike.
18 Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.
19 N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri.
20 Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.
21 Miriam we za ha, si, Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku; Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.
22 Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri.
23 Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara.
24 Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu?
25 Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N'ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ nwara ha;
26 si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.
27 Ha biarue Ilim, ebe isi-iyi iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di: ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'akuku miri.